Posts

Showing posts with the label Chukwuma Soludo

Anambra ga na-akwàlite ọdịmma ndị ntorobịa – Soludo

Image
Aka na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Chukwuma Soludo (nke mbụ n'aka ekpe) na ndị ọzọ, oge ọ na-anabata ihe onyinye ụmụakwụkwọ ahụ nyere ya na mmemme ahụ   Izunna Okafor dere akụkọ ndị a   AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwuola na gọọmenti ya agaghị ada mbà n'ịkwàlitè ọdịmma ndị ntorobịa steeti ahụ, ọkachasị site n'ịkụziri ha ọrụ aka dị icheiche na inye ha nkwàdó ga-eme ka ha bụrụ ndị kwụụrụ onwe ha.   Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a na mmemme imerubè ọgbụgba afọ iri abụọ na asaa nke ụlọakwụkwọ 'Holy Child Secondary School' dị n'Isuofia n'okpuruọchịchị ime Aguata nke steeti Anambra, bụ nke wééré ọnọdụ na nsonso a.   Ya bụ mmemme bụkwa nke dọtara imirikiti ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ nà mpụ̀ga ya, tinyekwara ụfọdụ ndị gụrụ akwụkwọ n'ebe ahụ.   N'okwu ya na mmemme ahụ, Gọvanọ Soludo nyèrè nkọwa banyere atụmatụ inye ọzụzụ nkụzi ahụ na-aga n'ihu na steeti ahụ ugbua, nke a maara dịka “One youth Two Ski

Ọtụtụ ndị mmadụ ezigarala Soludo ozi ekele ka ọ natachara asambodo

KA Ọ gachaara abalị olenaole nwa amadi ahụ a họpụtara ọhụrụ ịbụ gọvanọ steeti Anambra, bụ Ọkammụta Charles Soludo, nà osote ya, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim nwètèchara asambodo ha site n’aka ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị, bụ ụlọọrụ ‘Independent National Electoral Commission (INEC)’; ọtụtụ ndị mmadụ ka na-ezigara ya ozi ekele banyere ya bụ mmeri dara ụda o nwetere na nhọpụta ọchịchị ahụ.   Ọ dị ncheta na n’ịgbaso ihe dị na mpaghara iri asaa na ise nke akwụkwọ iwu na-achị nhọpụta ọchịchị n’ala Nigeria, bụ ‘section 75 of the Electoral Act 2010 (as amended)’, ụlọọrụ INEC nọrọ ụbọchị Fraịdee izuụka gara aga wee nye Ọkammụta Soludo na osote ya asambodo ahụ n’isi ụlọọrụ ahụ dị n’Awka.   N’okwu ya na mmemme inye asambodo ahụ, onye ji ọkwa ‘Supervising National Commissioner’ maka nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ e mere na steeti Anambra n’ahọ a, bụ Ọkaiwu Festus Okoye kelere ndị Anambra maka nkwụdosiike ha n’ọchịchị onye kwuo uche ya, ya na etu ha siri wee sonyesie ike na mmemme nhọpụta ọchịch

Soludo ga-ebido ebe m kwụsịrị – Obianọ

DỊKA nhọpụta ọkwa Gọvanọ ahụ a ga-eme n’ime steeti Anambra na-akpụdobe nso, aka na-achị steeti ugbua, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwuola na nwa amadi ahụ ji aha otu ndọrọndọrọ ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ were azọ ọkwa ahụ, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo ga-amalite ọrụ mmepe na ọchịchị steeti ahụ n’ebe ya onwe ya kwụsịrị tupu oge ọchịchị ya wee bịa na njedobe.   Gọvanọ Willie Obianọ kwupụtara nke a oge ndị otu ndọrọndọrọ ahụ na-abàgide na mmemme achụmta nkwàdo n’ime okpuruọchịchị ime obodo dị icheiche na steeti ahụ, nke gụnyere okpurọchịchị Njikọka, Anaọcha, Awka North na Awka South.   Mmemme achụmta nkwàdo ahụ bụ nke ọtụtụ ndị mmadụ nọ́gásị́ n’okpuruọchịchị ndị ahụ nupụtàrà n’ìgwè wee sonye na ya, ma bụrụkwa nke dọtagasịrị ọtụtụ ndị selitere isi nà ndị e ji okwu ha agba ìzù n’otu ndọrọndọrọ APGA.   N’okwu ya n’ebe ahụ, Gọvanọ Obianọ dụrụ ndị bịara mmemme ahụ ọdụ ka ha hụta ya dịka ihe dị óké mkpà ịpụtà n’ìgwè wee soro tụọ akwụkwọ ụbọchị ahụ a ga-atụ akwụkwọ, bụ abalị isii nke ọnw

Obiano agwala ndị Anambra ka ha tụnyere Soludo na Nov 6

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ adụọla ụmụafọ steeti ahụ ọdụ ka ha tụnyere onye ahụ ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressive Grand Alliance, (APGA)’ were azọ ọkwa gọvanọ steeti ahụ, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo, ka o wee nweta mmeri dara ụdà na nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ a ga-eme na steeti ahụ n’abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a.   Gọvanọ Obianọ nyere ndụmọdụ a n’ọgbakọ pụrụ iche ya na ndị ndu òtù ndọrọndọrọ APGA nwere n’ebe obibi gọọmenti dị n’Amawbịa, bụkwa ebe ọ nọrọ wee kelee ndị otu ndọrọndọrọ ahụ maka nkwàdo dị icheiche ha nyegoro ya kemgbe o jiri bata n’ọkwa ọchịchị wee ruo taa.   O kwere nkwà na ọ ga-emezucha nkwà dị niile o kwere tupu oge ọchịchị ya abịa n’isi njedobe, ma gwakwazie ndị òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ na ụmụafọ steeti ahụ na ọ dị óké mkpa na onye ọbụla tinyere aka n’ọrụ ma gbasie mbọ ike, iji hụ na APGA nwetere mmeri na nhọpụta ahụ a ga-eme na steeti ahụ, maka na ọchịchị APGA dị Anambra ahụ mma.   N’okwu nke ya, nwunye aka na-achị steeti ahụ, b

Soludo ga-eme karịa ka a tụrụ anya – Obiano

KA ọ gachaara ụbọchị olenaole e jiri gbapee amụmà achụmta nkwàdo nke Ọkammụta Chukwuma Soludo dịka onye ga-eji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressive Grand Alliance (APGA)’ wee zọọ ọkwaa gọvanọ na nhọpụta ahụ a ga-eme na steeti Anambra n’abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a; aka na-achị steeti ahụ, bụ Gọvanọ Willie Obianọ adụọla ndị eze ọdịnala ka ha nye nwa amadi ahụ ezi nkwàdo kwesiri ekwesi.   Gọvanọ Obianọ nyere ndụmọdụ a n’okwu ya na nzukọ pụrụ iche ya na ndị eze ọdịnala obodo dị icheiche na steeti ahụ nwere n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ na nsonso a, bụ nke ọ nọrọ na ya wee gosi ha Ọkammụta Soludo dịka onye ga-anọchi anya ya.   O mere ka a mara na ọchịchị APGA n’ime steeti ahụ kemgbe ahọ iri na isii gara aga dị Anambra ahụ mma, maka na nke ahụ bụ ihe a gbà n’aka e jighị ènyò elele. Ọ kọwara na aka chịbụrụ steeti ahụ n’oge mbụ, bụ Maazị Peter Obi mèrè nke ọma n’ọchịchị ya; kwuo na ya onwe bụ aka na-achị steeti ahụ ugbua emeela ọtụtụ ihe dara ụda n’agbanyeghị nsogbu ajọ ọnọdụ akụ

Isuofia echiela Soludo Dikeudo

IGBO sị na echichi na-ekwesi ekwesi, ma sịkwa na ọ na-abụ oke mmadụ nwee echichi, ọha mmụọ na ọha mmadụ amara aha echichi ya.   Obodo juru kpụmkpụm n’ọnụ na nsonso a n’Isuọfịa dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Agụata nke steeti Anambra, dịka eze, ndị ndu na ọhaneze obodo ahụ gbàkọrọ aka wee chie Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo echichi ọdịnala dịka ‘Dikeudo Isuọfịa’.   Ọkammụta Chukwuma Soludo, onye bụ nwaafọ obodo Isuofia, bụ onye jiri ọkwa dịka Gọvanọ ọba ego izugbe ala Nigeria, bụ ‘Central Bank of Nigeria (CBN)’ n’oge mbụ, ma bụrụkwa onye ji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressive Grand Alliance (APGA) apụta maka ịzọ ọkwa gọvanọ steeti Anambra na nhọpụta ahụ a ga-eme n’abalị isii nke ọnwa Nọvemba ahọ a.   N’okwu ya na mmemme ahụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ kọwara Ọkammụta Soludo dịka nwoke nwere ezi ọgụgụisi, onye ma nke ekwe na-akụ nà onye nwere ihe a chọrọ ma tozukwa òkè ịnọchi ya dịka Gọvanọ steeti ahụ ma ọ chịchaa rịtuo n’ọkwa n’ahọ na-abịa abịa.   Ọ kọw

Soludo ga-ewulite akụnaụba Anambra n'ụzọ bụ ịgba – Emecheta

ONYEISI ụlọọrụ, Anambra State Sinage and Advertisement Agency (ANSAA), Chief Jude Emecheta, bụkwa Onyeisioche Anambra Demand for Soludo egosipụtala obi aṅụrị ya na nturuugo nke Soludo nwetara dịka onye ga-eji otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA zọọ ọkwa Gọvanọ, na steeti Anambra na nhọpụta ọchịchị na-abịanụ. N’ajụjụ ọnụ a gbara ya, o kwuru sị: “Ana m ekele Chineke maka ịza anyị ekpere n’ihi na ọbụghị mgbe niile ka ihe mmadụ chọrọ na-emezu otu o siri chọ ya.Ya mere, ana m arịọ ka Chineke onye zara anyị igbu a na-aga n’ihu n’ịza anyị ekpere ganye na  e mechaa nhọpụta.”   Ọ kọwara na dịka onye ndọrọndọrọ ọchịchị, na ya na-ahụta ndị nwere nsọpụrụ na irube isi n’ebe otu ndọrọndọrọ ọchịchị APGA nọ dịka ndị ga-eji ya zọọ ọkwa ọchịchị. Ya mere, o kwuru sị na Soludo tozuru etozu. Ọ kọwara na dịka Soludo pụtara n’afọ 2013 maka ịzọ ọkwa ọchịchị ma onwetaghị, na nke ahụ emeghị ka ọ daa mba, kama ọ nọgidesiri ike na nhọpụta ọchịchị ahụ. O kwuru sị:” Soludo rụụrụ APGA ọrụ. N’ime afọ aọ so ya, o so Gọvanọ ga

ADS akpọkuola ndị Anambra ka ha kwado Soludo

NDỊ otu a kpọrọ Anambra Demands Soludo (ADS) wụchara n’ụlọọrụAnambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọakụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na Sportslight Xtra na Tuzdee, wee kwupụtaebumnobi ha nke ha chọrọ ka a mata.   Isiokwu ha bụ na hana-agba mbọ ka Ọkammụta Charles Chukwuma Soludo bụ nwaafọ Anambra jibu ọkwa dịkaonyeisi (governor) ụlọọbaego ala anyị, Central Bank of Nigeria pụta maka ịchịsteeti Anambra, ka ọ bụrụ ya ga-anọchị anya Chief Willie Obiano.   Onye ndu otu ahụ bụJude Emecheta kwuru sị na ha bịara ka ANPC gbasaa ozi ha ka ọha nụrụ ya. Okwuru sị: “Anyị bịara ka anyị kpọkuo ndị Anambra ka ha họpụta ezigbo mmadụga-anọchi anya Obiano, n’agbanyeghị otu ndọrọndọrọ ọchịchị onye nọ. Obianoakpaala ike dị egwu na steeti Anambra, ya mere anyị na-achọ onye ọzọ ga-eme karịa.Soludo bụ odogwu. Onye ọbụla maara ike ọ kpara na ihe gbasara ụlọọbaego.”   Emecheta kọwara na ọbụ site na ntụziaka Soludo n’oge ọchịchị Olusegun Obasanjo ka e ji wee chekwaaak

Soludo akpọkuola ndị Igbo ka ha tute mmụọ ịgba mbọ e jiri mara ha

A KPỌKUOLA ndị Igbo ka ha tute ma jigide mmụọ ịgba mbọ ahụ ejiri mara ha, ná-enyerịtara ibe ha aka, ma na-akwadokwara ụmụ na-eto eto ezi ọnọdụga-enyere ha aka ịga n’ihu, karịa iwere uchè na echichè ha niile tinye n’ihegbasaara igwù okwe ndọrọ ndọrọ ọchịchị, na onye ga-achị maọbụ onye agaghị achị. Oku a bụ nke a kpọrọ site n’ọnụ nwa amadi ahụ jibụrụ ọkwa dịkaonyeisi ụlọ ọba ego ala Nigeria n’oge gara aga, bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo,n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’ajụjụ ọnụ a gbara ha. Ọkammụta Soludo katọrọ etu ụfọdụ ndị Igbo si werezie uche haniile tinye n’ihe metụtara igwù okwe ndọrọndọrọ ọchịchị, ma chezọzie na e nwereụzọ dị iche iche ha si emesi ihe ike ma na-etikwa ịgba na-ada ụda na ngalaba dịiche iche, na-abụghị ngalaba ọchịchị, tinyekwuoro na onye ọbụla agaghị abụ onyeọchịchị. Dịka ọ na-akọwa na ịzọ ọkwa ọchịchị esoghị n’ihe ndị Igbojiri hiri isi, Ọkammụta Soludo gara n’ihu kpọpụtasịa ihe dị iche iche e jirimara ndị Igbo, nke gụnyere imesi ihe ike na ngalaba ọrụ ugbo na ọrụ aka,