Posts

Showing posts with the label Christiana Adeyeye

NAFDAC adọọla aka na ntị banyere mmanụ ọpapa e ji tanka kerozin buo, na nri e ji snaịpa chekwaa

ONYEISI zuzugbe ụlọọrụ National Agency for Food and Drug Administration and Control (NAFDAC), Ọkammụta Moji Christiana Adeyeye akpọkuọla ma dụọ ndị bi na steeti Kebbi ọdụ ka ha zeere ihe oriri, ọ kachasị mmanụ ọpapa ndị e ji ụgbọala tanka na-ebu mmanụ kerosin ekesa, tinyere mkpụrụosisi ndị e ji ọgwụ snaịpa wee chekwaa.   Adeyeye, onye nke onyeisi zoonu Northwest bụ Maazị Dauda Gimba nọchitere anya ya kwuputara nke ahụ na ọgbakọ nkuzi (sensitisation campaign) ụlọọrụ ahụ chịkọbara na Birnin Kebbi.   Ọ dọrọ ndị mmadụ aka na ntị sị: “Ọgbakọ nkuzi a bụ iji kọwaa maka nsogbu dị n’iji ụgbọala tanka na-ebu kerozin, wee na-ebukwu mmanụ ọpapa, nsogbu iji ‘potassium bromate’ eme achịcha (bread), nsogbu iji ọgwụ snaịpa wee chekwaa erimeri n’ụdị ọbụla maọbụ chụpụ ijiji n’anụ. Iri erimeri e ji tanka na-ebu kerozin wee kesaa, na erimeri e ji ọgwụ ‘insecticide’ chekwaa dị njọ n’ahụ mmadụ. Ya mere, NAFDAC na-adụ ọha na eze ọdụ ka ha gbaara iri ụdị erimeri na mkpụrụosisi ndị ahụ ọsọ.”   Ọ gara n’ihu kpọ