Posts

Showing posts with the label Chris Ngige

Ngige ekwela nkwa ezi nkwado ya n'ọchịchị Soludo

MINISTA na-ahụ maka ọrụ n’ala anyị (Minister of Labour and Employment) Sinetọ Chris Ngige ekwela nkwa iwudo ọchịchị Gọvanọ a họpụtara na steeti Anambra bụ Ọkammụta Chukwuma Soludo aja n’ukwu.   O kelekwara ndị ọgba egbe maka itinye mma ha n’ọbọ nke mere ka nhọpụta ọchịchị ọkwa gọvanọ e mere na steeti Anambra gaa sịrịrị werere.   Ngige, onye bụ otu n’ime ndị ọnụ ruru n’okwu n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC) oge ọ na-ekele Gọvanọ ahụ a họpụtara ọhụrụ bụ Chukwuma Soludo na òtù ndọrọndọrọ ọchịchị ya bụ All Progressives Grand Alliance (APGA) maka ugo ha tuuru kwere nkwa inye ha nkwado iji mee ka ọchịchị ha gaa nke ọma.   Ngige kwuru sị: “A chọkwuru m ikele ndị Anambra maka ịpụta n’igwe n’agbanyeghị egwu nsogbu, igbu mmadụ na ntọrị a hụtara ọtụtụ izuụka tupu nhọpụta ọchịchị ahụ ewere ọnọdụ.   Dịka m na-eto ha ka m na-etokwa ndị ọgba egbe ‘known and unknown’ maka ịnụrụ ndị okenye okwu ma ghọta na o kwesịrị ka a hapụ Ndị Anambra ka ha họpụta onye ndu ha chọrọ.”   Otu o s