Chimamanda Adichie enwetala onyinye nkwanye ugwu ọzọ
NWADA Igbo nke Nigeria nke ụwa nile maara make ide akwụkwọ bụ Chimamanda Ngozi Adichie e nwetala nkwanye ugwu site n’aka otu a kpọrọ Global Hope Coalition (GHC). O tutere ugo a dịka ndị GHC mere emume ome n’afọ ha nke e mere n’obodo New York. Dịka ndị chịkọbara emume ahụ siri kwu, a kwanyeere Adichie ugwu a n’ihi mbọ ya n’edemede. Nke a bụ nnọọ iji kwado ilu Igbo nke kwuru na akwụkwọ juru ọhịa mana a bara na ya chọba ọkazị. A nọkwa na mmemme ahụ sọpụrụ mmadụ ise si mba Tanisia, Denmark, France, Sudan na Mali n’akụkụ nke ha. Ha jikwara ohere ahụ wee too ndị ndu dị iche iche bụ ndị gbatara ndị gbapụrụ n’obodo ha na mba ụwa dị iche iche maka nsogbu ọsọ enyemaka.