Posts

Showing posts with the label Chike Okoye

Ndị odee n'Igbo ga-eto Ọkammụta Okoye taa

NZUKỌ Ndị Odee Igbo ga-enwe ọgbakọ mbụ ha iji kwanyere otu onye nke ha bụ Chike Okoye ùgwù maka mbuli n’ọkwa nke ogo ọkammụta e buliri ya na nsonso a.   Ọ bụ taa, bụ abalị mbụ nke ọnwa Julaị ahọ 2021 ka a ga-eme ya bụ ọgbakọ.   Ebe nnukwu ọgbakọ a ga-ewere ọnọdụ bụ n’ogige ụlọọrụ ‘Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), bụ ụlọ mbipụta akwụkwọ akụkọ ‘National Light’, Ka Ọ Dị Taa na ‘SportslightXTRA’, dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra.   Ya bụ ọgbakọ ga-amàlitekwa n’elekere anọ nke mgbede kpọmkwem.   A na-akpọkukwazị ọhaneze, ndị ihe ọma na-adị mma, na ndị ọbụla nwere mmasị n’ihe gbasaara asụsụ Igbo ka ha nọrọ ebe ahụ ma sonye na nnukwu ọgbakọ a pụrụ iche, iji kwanyere óké mmadụ a ùgwù.