Posts

Showing posts with the label CPHA

Nwoke Ilonzo tutere n'ọnwụ na 1988 alachighaala na CPHA

Image
… Bunye Ilonzo ụkpa ekene ONYEISI ụlọọrụ na-eji ihe ndị a na-eri eri n’ala anyị agwọ ọrịa, Centre for Psychic and Healing Administration (CPHA) bụ Oriakụ Flora Ifeanyichukwu Nkemakonam Ilonzo (Anyafulugo n’Enugwu-Ukwu na Umunri) onye so n’otu World Drug Information egosipụtala ọńụ dịka otu nwoke ọ tutere n’ọnwụ afọ iri atọ na atọ gara aga nwetere onwe ya na nsogbu amazighị onwe ya o nwere nso nso a, site n’ọgwụgwọ onyere ya.   Nwoke ahụ aha ya bụ Gaius Ejiogu, onye Orodo nke dị na Mbaitolu na steeti Imo kwuru na ọ bụ Oriakụ Ilonzo gwọrọ ya, ebe nwunye ya bụ Oriakụ Appolonia Ejiogu kwuru sị na o teela mgbe ha na Oriakụ Ilonzo matara. O kwuru sị: “Anyị matara ya kemgbe 1988, oge di m nwere nsogbu ọrịa mkpọnwụ ahụ (stroke).Dịka a chọpụtara na ọ gafeela, anyị kpebiri ibu ya bịa na CPHA ma ikwu na ibe ya ekweghị n’ihe na ha sịrị na anaghị akụ ọka n’ebe a wụrụ simenti. Ma n’ime ihe niile anyị jụrụ ma buru ya bịawa na CPHA, ka anyị bịaruru, Anyafulugo mere ka ọ dịkwa ndụ. Kemgbe ahụ wee ruo t