Posts

Showing posts with the label CP Monday Bala Kuryas

Emeela Kuryas onyeisi ndị uweojii n'Anambra

IGBO sị na ọ na-adị mma a sụgide ụtara, e hogharịa ọdụ.   N’ịgbasò nke a, CP Monday Bala Kuryas, fsi, awụchaala ma malite ọrụ na steeti Anambra dịka onyeisi ọhụrụ nke ndị uweojii na steeti ahụ, ma bụrụkwa onyeisi nke iri abụọ na iteghete steeti ahụ nwègoro, dịka onye jibụ ọkwa ahụ bụzị onye nke e buliri n’ọkwa dị elu ma wegazie ya n’ebe ọzọ.   N’okwu ya na mmemme mkparịtaụka mbụ ya na ndị nta akụkọ nwere n’isi ụlọọrụ ndị uweojii steeti ahụ dị n’Amawbia, CP Kuryas kelere AIG John Abang, bụ onyeisi ndị uweojii ahụ nke pụrụ àpụ na steeti ahụ na nsonso a, maka ezi agbambọ ya ime ka steeti Anambra bụrụ steeti kachara nwee ezi nchekwa n’ala Nigeria, dịka ọ dị taa.   Ọ kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe a gwagoro ya kacha echere ọnọdụ nchekwa aka mgba na steeti ahụ, nke gụnyere ohi, ịtọrọ mmadụ, otu nzuzo, ịma aka akpà, nsogbu ịzọ ókè ala, nsogbu ịzọ ọchịchị obodo, nsogbu ndị Fulani na-achị ehi na ndị ọrụ ugbo, tinyere nsogbo ndị ọzọ, ma mee ka a mara na ụlọọrụ uweojii steeti ahụ ga-aga n’ihu ịrụsi ọrụ ik