Nwa afọ Igbo eturula ugo na mba US maka inye aka mepụta ọgwụ nje korona
ỤLỌỌRỤ mba America n’ala anyị, ‘The United States Embassy Nigeria’ etoola dọkịnta onye Nigeria bụ Onyema Ogbuagu maka mbọ ya n’ịhụ na e nwetara ọgwụ na-ahụ maka korona (COVID-19 vaccine) n’America. N’ozi ya na mgbasaozi ọgbara ọhụrụ ‘tweeter,’ US mission n’ala anyị kwuru sị, “ndị Nigeria na-atụnye ụtụ ha n’ebe ụwa nọ n’ụzọ dị iche iche. Okpu anyị dị n’elu n’ebe Dọkịnta Onyema Ogbuagu na Yale nọ, onye nyere aka mepụta COVID-19 vaccine.” Ogbuagu bụ ọkammụta n’ihe gbasara ahụike (Associate professor of medicine) na mahadum Yale University. Ọ bụ otu onye n’ime ndị nọ n’isi na nchọcha (research) na Pfizer bụ ụlọọrụ na-arụpụta ọgwụ na USA maka COVID-19 vaccine na mba ahụ.