Adọọla ndị ọkwọ ụgbọala, ọgbatumtum na COOU aka na ntị
ONYEISI ụlọakwụkwọ (vice chancellor) Chukwuemeka Odumegwu Ojukwu University (COOU) bụ Ọkammụta Greg Nwakoby adọọla ndị na-anya ọgbatumtum e ji akpa ego (ọkada) tinyere ndị na-anya ụgbọala aka na ntị ka ha kpachara anya ha banyere otu ha si agbagharị n’okirikiri ụlọakwụkwọ ahụ. Ọkammụta ahụ kwuputara nke a n’ihi ọtụtụ ihe mberede nke dapụtara n’okporoụzọ Igbariam bụ nke gburu ọtụtụ ụmụakwụkwọ. O kwuru na ndị nlekọta ụlọakwụkwọ ahụ azọpụla ụkwụ ije iji wee na-enyocha oke waawaawaa ndị ọgbatumtum na ụgbọala na-agba n’okirikiri ahụ. N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ, Ọkammụta Nwakoby kwara arịrị maka ndụ ndị a tufuru n’ihe mberede ndị ahụ niile mere nụ, ọ kachasị nke ụmụakwụkwọ COOU, bụ nke ọ kọwara dịka oke ihe nwute na ihe ịgba anya mmiri; ma kpee ekpere ka Chineke nabata mkpuruobi ha. Ọ gara n’ihu kasie ndị niile ọnwụ ụmụakwụkwọ ahụ metụtara dịka ezinaụlọ, ngalaba (departments) tinyere ndị enyi ha. O kwere nkwa na site n’ụkwụ ije ha zọpụgoro iji gbochie ihemberede idakpokwa ụmụakwụkwọ