Posts

Showing posts with the label By Izunna Okafor

A rịọla ụmụafọ Anambra ka ha malite ịzụ ehi Igbo

N’IHI na a sị na ọ na-adị mma ji mee ka ọ bụ ya tọkarịrị n’ụtọ, a hapụ ya gbuo ede awaị; a kpọkuola ma dụọ ụmụafọ steeti Anambra na ụmụ Igbo n’izugbe ka ha malite ịzụ ehi Igbo, dịka o so n’otu n’ime ngalaba ọrụ ugbo kwesiri ka e lebàra ya anya nke ọma ugbua ma were ya kpọrọ ihe. Ọ bụ onyeisi ụlọ ọrụ ‘Eagles Food Processing Industry Nig. Ltd’ bụ Maazị Ugochukwu Okpaleke kpọrọ oku a ma nye ya bụ ndụmọdụ n’ajụjụ ọnụ Ka Ọ Dị Taa gbara ya n’isi ụlọ ọrụ ya dị n’Ụmụchu, n’okpuru ọchịchị Agụata na steeti Anambra, banyere ọgbụgba ahọ iri abụọ na asatọ nke steeti ahụ. Ọ gbara akaebe na ya bụ steeti na-emezị nke ọma na ngalaba ọrụ ugbo karịa n’oge mbụ, ma kwuo na n’agbanyeghị nke ahụ, na ọ ka nwegasịrị ụfọdụ akụkụ ngalaba ahụ kwesiri ka e lebàra ya anya, bụ ngalaba ịzụ ehi Igbo na ihe ugbo ndị ọzọ e nwere ike ịkọ na steeti ahụ, mana a ka na-atụbàta ha na steeti ahụ. O mere ka a mara na ihe o jiri dị ka ọ bụ ehi Awụsa ka ndị mmadụ na-akacha ego na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị bụ maka na o