Posts

Showing posts with the label Buhari

Nbuli Bishọp Okpaleke ka ọbụrụ Kadinal ga-abara Nigeria uru – Buhari

DỊKA ndị mmadụ na-aga n’ihu na-ekele Chineke maka nhọpụta a họpụtàra Bishọp Okpaleke ịbụ Kadịnal, Onyeisiala Nigeria, Muhammadu Buhari esorola wee kwupụta afọojuju o nwere maka ya bụ nhọpụta Poopu Francis họpụtara nwa afọ Nigeria ịbụ Kadịnal.   Onyeisiala Buhari, n’ozi ekele ọ kụpụ̀rụ̀ na nsonso a n’Abuja site n’aka nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye ya n’ihe gbasara mgbasaozi, Mallam Garba Shehu, kwùrù na Bishọp Okpaleke tozuru nkeọma maka ọkwa ahụ, ma gaa n’ihu kwuo na ọnọdụ ya ka Kadinal ga-abara Nigeria uru n’ọtụtụ ụzọ.   Dịka ọ na-egosịpụta ọṅụ ya maka nhọpụ̀ta ahụ a họpụtara Bishọp Okpaleke nke dayọsis Ekwulobia dị na steeti Anambra, Onyeisiala Buhari mere ka a mara na ya bụ Kadinal a họpụtara ọhụrụ abụrụla Kadịnal nke anọ Nigeria na-enwe. Ndị ọzọ bu ya ụzọ gụnyèrè Francis Arinze, Anthony Okojie na John Onaiyekan. Bishọp Okpaleke sòkwàzị̀ na Kadinal iri abụọ na otu Popu Francis họpụtara n’abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Mee ahọ a.   Dịka Mallam Garba Shehu siri kwuo n’ozi ahụ

Buhari ekeleela Queen Elizabeth n'ọ̀gbụ̀gbà ahọ 70 n’ọchịchị

ONYEISIALA Nigeria, Muhammadu Buhari ekeleela Queen Elizabeth nke abụọ, ka o mere afọ iri asaa ọ malitere ọchịchị na mba Britain, nke bekee kpọrọ ‘platinum jubilee’.   Dịka ozi a kụpụ̀rụ̀ site n’aka nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye Onyeisiala n’ihe gbasara mgbasaozi, Garba Shehu siri kọwaa, Buhari sị na ya sonyeere ezenwaanyị ahụ dịka ọ na-eme emume afọ iri asaa ọ nọọrọla n’ocheeze, tinyere Onyeisi Commonwealth of Nations; nke Nigeria bụ otu n’ime ha.   Buhari rụtụrụ aka na Queen Elizabeth nke abụọ bụ onye ọchịchị mbụ nke mba Britain nọruru afọ iri asaa n’ocheeze.  N’ozi ahụ ọ kụpụ̀rụ̀ maka nnukwu mmemme ahụ pụrụ iche, Onyeisiala Buhari rụtụrụ aka na Queen Elizabeth ahụ akpaala ike dị egwu, nke gụnyere ịbụ onye kacha bụrụ nwata wee nọọ n’oche eze ahụ, iji ezi ntụkwasịobi na amara wee na-ahazi ọrụ ya, tinyekwuoro ịbụ onye ọchịchị ya kachagoro too ogologo.  Onyeisiala gosipụtara afọ ojuju o nwere n’ebe ezenwaanyị ahụ nọ, dịka onye ndu maara ihe ekwe na-akụ, onye ọnọdụ na ọdịmma ndị ọ n

A gam elebàgharị anya n'ihe banyere ịtọhapụ Nnamdị Kanụ — Buhari

ONYEISIALA Nigeria, bụ Muhammadu Buhari ekwuola na ọ ga-elebàgharị anya n’ihe gbasaara ịtọhàpụ onyeisi ndị òtù IPoB, bụ Maazị Nnamdị Kanụ, bụ onye e jidere ma kpọchie ya n’ụlọọrụ ndị ọrụ nchekwa ‘Department of State Service (DSS) kemgbe ọnwa olenaole gara aga ugbua. Onyeisiala Buharị kwupụtàrà nke a n’okwu ya oge ndị ndu na ndị e ji okwu ha agba izu n’ala Igbo gara kpọtụrụ ya n’isi ụlọọrụ ya dị n’Abụja, bụ isi obodo Nigeria maka ịgwa ya okwu banyere ịtọhapụ ya bụ nwa amadi ka ọ laara onwe ya. Ndị ahụ e ji okwu ha agba izu sóró wee gaa njem mkpọtụrụ ahụ gụnyere Gọvanọ chịbụrụ steeti Anambra n’oge mbụ, bụ Dọkịta Chukwuemeka Ezeife; onye mbụ jiri ọkwa dịka Minista na-ahụ maka njem ọdụ ụgbọelu n’ala Nigeria, bụ Mbazulike Amaechi; Bishọọpụ Sunday Onuoha; onyeisi òtù Aka Ikenga n’oge mbụ, bụ Goddy Uwazurike. Ndị ha na onyeisiala nọ oge a bịara njem mkpọtụrụ ahụ gụnyere Minista na-ahụ maka ọrụ oyibo na iwè n’ọrụ, bụ Dọkịta Chris Ngige; Minista na-ahụ maka nkànụzụ, bụ Ogbonnaya Ọnụ; Minista na

Buhari akpọlitela onyeisi ndị uweojii ọhụrụ

ONYEISIALA Nigeria, Muhammadu Buhari agwala onye nọbu n’isi ndị uweojii, bụ IGP Muhammed Adamu ka ọ labazie ezumike nka; ma kpọlitekwazie DIG Usman Alkali Baba ka ọ ka jidegodi ọkwa ahụ ugbua. Ọ gwakwara Baba ka ọ malitekwa ọrụ ozigbo dịka onyeisi ndị uweojii n’ala Nigeria.   Minista na-ahụ maka ihe gbasaara ndị uweojii n’ala Nigeria, bụ Maigari Dingyadi bụ ya mere ka a mara nke a n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ n’isi ụlọọrụ ya dị n’Abuja, bụkwa nke ọ nọrọ na ya wee kọwaa na mkpọlite ahụ a kpọlitere Dingyadi bụkwa nke malitere dịba ìrè ozigbo ozigbo.   Ọ dị ncheta na oge ezuola mgbe IGP Adamu kwesiri iji laa ezumike nka, mana onyeisiala Buhari nọrọ n’abalị anọ nke ọnwa February ahọ a wee gbatịwanyekwuo oge ya, sị ya nọkwuo ọnwa atọ.   Mana ka o sila dị, oge ya bụ onyeisi ndị uweojii IGP Adamu gara njem nleta n’ebe ndị ahụ ndị omekoome gbara ogige ndị uweojii ọkụ ma kpakwa mkpamkpa dị iche iche na nsonso a na steeti Imo; onyeisiala Buhari, onye nọ na London ugbua, nọrọ ebe ahụ gwa IGP Adam

Buhari achụọla ndị isi ọrụ ngalaba nchekwa, kpọlite ndị ga-anọchi anya ha

IGBO sị na ọ na-adị mma a sụgide ụtara, e hogharịa ọdụ; ma sịkwa na ọ na-adị mma akpụ kwụọ ụdọ, a chọọrọ ya mmiri ịkwọ aka.   N’ịgbaso nke a, onyeisiala Nigeria, bụ Muhammadu Buhari achụtuola mmadụ anọ bụ ndị isi ọrụ ngalaba nchekwa anọ dị iche iche, bụ ndị a maara dịka ‘Service Chiefs’ n’ọkwa, ma sị ha gazie zuo ike ka ndị ọzọ nwàkwa ike ha.   Nke a bụ nke e kwupụtara site n’ọnụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nye onyeisiala n’ihe gbasaara magbasaozi, bụ Maazị Femi Adesina, bụ onye kụpụụrụ ndị nta akụkọ ozi na nsonso a banyere nke ahụ, nke o sitere na ya mee ka a mara na onyeisiala Buhari gwakwara ndị ahụ ka ha laa ezumike nke ozigbo ozigbo.   Adesina nyere aha ndị ahụ a chụturu n’ọkwa dịka ‘General’ Abayomi Olonisakin bụ onye ji ọkwa ‘Chief of Defence Staff’ nke pụtara onyeisi ndị ọrụ nchekwa gburugburu ala Nigeria; ‘Lt-General’ Tukur Buratai bụ onye ji ọkwa dịka ‘Chief of Army Staff’ ma bụrụ onyeisi ndị ọrụ agha ala Nigeria; ‘Vice Admiral’ Ibok Ekwe Ibas bụ onye ji ọkwa ‘Chief of Naval Staff

Obianọ ayọọla Buhari ka o leba anya na mmebi ụzọ Gọọmenti Etiti mebisịrị n'Anambra

BUUSU sị na ọ bụ mmekọrịtaahụ bụ ụtọ nwanne.   Ọ bụ n’ịgbasò nke a ka aka na-achị steetiAnambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ jiri nọrọ na nsonso a wee ga kpọtụrụ onyeisiala Nigeria, bụ Muhammadu Buhari n’isi ụlọọrụ ya dị n’Aso Rock, Abụja, ebe haabụọ nọrọ wee kpaa nkàtá bànyere ọnọdụ ụfọdụ na ihe olenaole na steeti ahụ.   N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ oge ya naonyeisi ala nwechara nzukọ ahụ, Gọvanọ Obianọ mere ka a mara na ọ na-adị abịaruteizute onyeisi ala na mgbe na mgbe, ma kọwaa na njem nke a ọ bịara bụ nke ọ nọrọna ya wee kọwaara onyeisi ala Buhari bànyere ọnọdụ okporo ụzọ gọọmenti etiti dịgasịna steeti, àkwà mmiri Niger nke abụọ, iju mmiri na-awa na steeti ahụ na ụfọdụihe ndị ọzọ.   O mere ka a mara na ụfọdụ okporo ụzọ gọọmentietiti dị na steeti ahụ, ọkachasị okporo ụzọ awara-awara ahụ siri Enugu gaa Ọnịtsha,nọ n’ajọ ọnọdụ ugbua ma bụrụkwa nke chọrọ mgbata ọsọ aka-ọkụ aka-ọkụ iji weedozie ha, gbochie ha imebiri gaa n’ihu, ma gbochikwa ihe mberede okporo ụzọ na ụfọdụihe ndị ọzọ ajọ ọnọ

COVID 19 - Onyeisiala agwala ndị nta akụko ya ka ha si n'ụlo na-arụgodị

ONYEISIALA Nigeria bụ Muhammadu Buhari agwala ndị ntaakụkona-arụrụ ha orụ (media staff and state house correspondents), bụ ndị bịaraolili Abba Kyari (Chief of Staff), ka ha si n’ụlo na-arụgodi orụ wee ruo abalịiri na ano.    Ka anyị cheta naKyarị nwụrụ na Fraidee izuụka gara aga na Lagos, ebulota ya Abuja lie ya ebeolili ozu, Gudu cemetry ụbochị ụka dịka e kpechaara ya ekpere n’ụlo ya naSatodee. Ozi ndụmodụ nke Attah Esa bụ osote onyeisi mgbasaozi (Deputy Director of information), tinyere aka na ya kwuru sị ka ndị nta akụko ahụhapụgodu ịbịa orụ n’obi goomenti ala anyị, State House, Abuja wee ruo abalị iriano, tinyekwara na ha ga-elebara ahụike ha anya dịka o kwesịrị. Tupu nke a, onye enyemaka pụrụ iche nye onyeisiala (SSA),n’ihe gbasara mgbasaozi bụ, Garba Shehu adịla na mbụ kwuo na nke ahụ bụ makaigbochi coronavirus. Na mmalite coronavirus n’Abuja, e webilatara onụogụ ndịntaakụko na-ahụ maka ihe na-eme n’isi obi goomenti.

Korona: Buharị agbatịkwuola oge onye apụtakwala ezi n’Abuja, Lagos, Ogun

ONYEISIALA Nigeria, bụ Maazị Mụhammadụ Buharị ejirila izuụkaabụọ wee gbatịwanyekwuo ụbọchị onye apụtakwala ezi na steeti Lagos, steetiOgun, na FCT, bụ isi obodo ala ahụ.   Onyeisiala, Buharịkwupụtara nke a site na mgbasaozi pụrụ iche o mere ụbọchị Mọnde, bụkwa nke ọ nọrọna ya wee kọwaa ka eke si anya anwụ ugbua, dịka o siri metụta ọrịa nje koronan’ala Nigeria.   Ozi ahụ ya bụonyeisiala nọrọ n’Abụja wee gbasaa, bụ nke gazùrù ala Nigeria niile, ma bụrụkwamgbasaozi izugbe nke abụọ ọ na-eme bànyere ya bụ ọrịa, ka o mechaara nke mbụn’abalị iri abụọ na iteghete nke ọnwa Maachị ahọ a.   N’okwu ya namgbasaozi izugbe ahụ o mere nso nso a, onyeisiala kèlèrè ụmụafọ ala Nigeriamaka ndidi, ogologo ntachiobi na nrubeisi ha nyegara ntụziaka dị iche iche gọọmentịwepụtara banyere ọrịa nje korona.   Ọ fọkwara ekele n’ụkpawee bunye ndị ọrụ ahụike ala Nigeria, ndị ọrụ nchekwa, ndị ndu okpukperechi dịiche iche, ndị ọchịchị nakwa ndị ọzọ nyegoro aka ma ka na-enyekwa aka n’ụzọ dịiche iche ịhụ na ndị mmadụ ru

2019: Otu nnọrọ onwe arịọla ka akwado Buhari

ÒTÙ a kpọrọ “Good Governance Ambassadors of Nigeria” (GOGAN), bụ òtù nnọrọ onwe akpọkuola ụmụafọ Nigeria ka ha kwàdo onyeisi ala, bụ Maazị Muhammadụ Buharị maka ọchịchị ya nke ugbòrò abụọ. Onyeisi ndị otu a na steeti Anambra bụ Maazị Johnbosco Ọnụnkwọ kpọrọ oku a n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, oge ndị otu ahụ karịrị puku abụọ n’ọnụ ọgụgụ nuputara n’igwè wee mee ngagharị iji gosìpụta nkwàdo ha nye onyeisi ala Buharị, bụkwa nke ha nọrọ na ya wee malite nhazi achụm nta nkwàdo a kpọrọ ‘Buhari Unity Band’. Ọ kọwara Buharị dịka nwoke maara nke ekwe na-akụ n’ihe gbasaara ọchịchị obodo, kwuo na o wulitela ọnọdụ mmepe ala anyị n’ụzọ pụtara ihe, kwàlite ọnọdụ akụnụba ala anyị, ma mepùtela ọtụtụ ihe a hụrụ anya n’ala n’ime ihe erubeghị afọ anọ o jiri bànye n’ọkwa ọchịchị. Maazị Ọnụnkwọ mere ka a mara na ala Nigeria nọ n’ajọ ọnọdụ tupuu ọchịchị Buharị wee bàta n’ọgbọ, mana ugbu a, ya bụ onyeisiala egosila n’ezie na ọ bụ ọka ibè n’ịhe gbasaara ịchị ezi ọchịchị na ịhazi ọnọdụ akụnụba. Ọ kpọpụtasịrị

Buharị kwesịrị ịga zuo ike – Oyedepo

Izunna Okafor   ONYE ndu ụlọ ụka Living Faith Church n’ụwa gbaa gburu gburu, bụ Bishọọpụ David Oyedepo akpọkuola onyeisi ala anyị bụ Mụhammadụ Buharị ma rịọ ya doo doo doo ka o gazie zuo ike gwụrụ ya agwụ site n’ịgba a rụkwaghị m n’ọkwa ya dịka onyeisi ala, n’ihi idà mbà ya n’ọrụ.   Maazị Oyedepọ kpọrọ oku a ụbọchị ụka gara aga n’ozi ọma ya n’Ọta, nke steeti Ogun, bụkwazị nke mere ka o soro n’otu n’ime ọtụtụ ndị isi ụka dị iche iche gwagoro ya bụ onyeisi Buharị ka ọ gbaa a rụkwaghị m ma were nwayọ ga zuo ike gwụrụ ya agwụ.   Na ya bụ okwuchukwu, ọ gwara ndị ụka ya na ọ bụ eziokwu bụ na o nweghị otu ndọrọ ndọrọ ọbụla ọ nọ na ya, mana ya agaghị adị ndụ gbachị nkịtị banyere otu ndị Fụlani na-achị ehi si egbusi ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha na mpaghara ebe dị iche iche n’ala anyị. Ọ jụrụ ajụjụ banyere ihe o jiri bụrụ naanị na mpaghara ebe ndị otu Christi jupụtara ka ihe ahụ na-eme, na ihe mere na o nwebeghị otu onye n’ime ndị Fụlani ahụ a nwụchikọgoro ma ọ bụ kpụpụ ya ụlọ ikpe, na-agbanyeghị ọt

Igbusi ndị mmadụ na Plateau: Onye kwuru na m gbara nkịtị? – Buharị

ONYEISI ala anyị bụ Muhammadụ Buharị akọwaala ya dịka nkọghèri na asị ocha ghe anya oghe, bụ akụkọ ahụ ndị mmadụ na ebugharị na-asị na o nweghị ihe ọbụla nwere isi o kwuru banyere mgbusi ahụ e gbusiri imirikiti ụmụ mmadụ aka ha dị ọcha na steeti Plateau n’izu ụka gara aga site n’aka ndị Fụlani, ma gọọ aka na ọkpa ya banyere nke ahụ, ọ bụnadị dịka o mere ka a mara na o kwuru ihe o kwesiri ikwu.   Nke a bụ nke e mere ka ọ pụtakwuo ihè site n’aka nnukwu onye enyemaka pụrụ iche nye ya bụ onyeisi ala na mgbasa ozi, bụ Mazị Garba Shehu, bụ onye mekwara ka a mara na Buharị kwuru okwu banyere mgbusi ahụ oge ya na ndị e ji okwu ha agba izu na Jọs nwere nzukọ iji kpaa banyere nke ahụ. Onyeisi ala n’onwe ya bụ Buharị akatọọla kpam kpam otu ndị mmadụ si ekwu na o nweghị ihe ọ bụla nwere isi o kwuru banyere ọnọdụ ahụ n’ihi na ya onwe ya dịkwa ka otu onye n’ime ndị Fụlani ahụ na-achị ehi; o wee kpọkuo ụmụafọ Nigeria ka ha ghara ịña ntị n’akụkọ ahụ ọ kọwara dịka nke enweghị isi na ọdụ, dịka o kwuru n

Ọchịchị m emeela ka Nigeria bụrụ sọ mma – Buharị.

ONYEISI ala anyị bụ Muhammadụ Buharị emeela ka a mara na ọchịchị ya edebela ala Nigeria n’ezi ọnọdụ magburu onwe ya  ma mekwa ka ọ bụrụ obodo e ji ama atụ n’ogogo mba ụwa, na-agbanyeghị ihe iche aka mgba dị iche iche ọ na-agabiga. Buharị mere ka a mara nke a n’okwu ya na nzukọ ndị isi ọchịchị otu ndọrọndọrọ APC nwere ụbọchị Tuuzdee n’isi ụlọ ọrụ ha dị n’Abụja, ma kwuo na obi atọgbuola ya banyere otu ọchịchị ya siri weta ezi mgbanwe na mmepe dị ukwuu na ngalaba nile nke ala anyị. Ọ kọwara na ọchịchị ya emeela ka Naịra siwanye ike, kwalite ezi ọnọdụ akụnụba, weta ezi ọnọdụ nchekwa, ma belatakwa imefusi ma ọ bụ izofu ego ọhanaeze, na ọtụtụ mpụ na aghụghọ ndị ọzọ o gbulagoro kpam kpam, ma kọwaa na nke ahụ bụ ngosiputa na nhazi doro ya anya nke ọma. O kwuru na ụmụafọ Nigeria kwesikwara ikele ndị gọvanọ ji aha otu ndọrọndọrọ APC achị na steeti dị iche iche na ndị ndu otu ahụ na steeti dị iche iche n’ihi ntụnye ha dị oke ọnụ. O kelekwara ndị ọrụ nchekwa, ọ kachasị ndị ọrụ agha ala anyị, bụ nd