Posts

Showing posts with the label Bubendorff Memorial Grammar School

Obianọ ekwela nkwà ịkwàlitekwu usoro mmụta ọgbara ọhụrụ n’Anambra

AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ ekwela nkwà ịkwàlitekwu usoro mmụta ọgbara ọhụụ n’ime steeti ahụ. Aka na-achị achị bụ Obianọ kwuputara nke a n’okwu ya na mmemme icheta ọgbụgba ahọ iri isii nke ụlọakwụkwọ ‘Bubendorff Memorial Grammar School Adazi-Nnukwu’, bụkwa nke weere ọnọdụ n’ogige ụlọ mmụta ahụ, dị n’okpuru ọchịchị Anaọcha. Ka ọ na-akpọpụtasị ịgbà dị iche iche ọchịchị ya tigoro na ngalaba mmụta na steeti ahụ, o kwùru na ya amalitelarị ịbanyè n’usoro mmụta ọgbara ọhụụ, makpọkuzie ụmụakwụkwọ steeti ahụ sonyesie ike na nke ahụ dịka ihe dị oke mkpà, n’ihi na mba ụwa dum na-abanyezị n’usoro dijitaalụ ugbua. O kwuru na, n’ịkwàlite nke ahụ, na ọchịchị ya ka na-arụkwu ụlọakwụkwọ pụrụ iche, iji kwàlite ya bụ usoro mmụta ọgbara ọhụụ nakwa ime ka ụmụakwụkwọ steeti ahụ nweta mmụta na asambodo n’atụmatụ ọmụmụ ihe kọmputa dị iche iche, ọbụnadị dịka ọ kpọkùzịrị ụmụakwụkwọ ka ha sonyesie ike na nke ahụ, ma zeere ịba n’otu nzuzo na itinye aka n’ihe ndị ọzọ na-eweta ala adịghị mma