Ndị Boko Haram egbuola ndị ọrụ ugbo iri na anọ na Borno
MMADỤ iri na anọ bụ ndị ọrụ ugbo nọrọ na nsonso a wee zùte ọnwụmberede ha site n’aka ndị òtù agha isi ekwe ọnwụ bụ Boko Haram. Nke a bụ nke e mereka ụwa mara site n’ozi a kụpụrụ ụbọchị Tuzdee site n’aka ndị ọrụ nchekwa obodosteeti ahụ. Dịka ya bụ ozi sirikọwaa, ndị agha isi ekwe ọnwụ ahụ bụ Boko Haram jidèrè ndị ọrụ ugbo mmadụ irina ise ebe ha nọ n’ugbo ha elekọta ma na-agba ihe ha kụrụ n’ubì mmiri, naNgwom, nke jiri kilomita iri na anọ wee dị anya n’isi obodo steeti Borno bụMaiduguri. Ka ha jidechara ndị ọrụ ugbo ahụ, ha tinyèrè ha niile mmà n’olu, mabepu ha isi ozigbo ozigbo. Ozi ahụ mere ka amara na ọ bụ mmadụ iri na anọ n’ime mmadụ iri na ise ahụ nwụrụ, ebe otu onye fọrọafọ nọzịkwa n’ọnọdụ ‘ọdị ndụ ọnwụ ka mma’ n’ihi na ha jiri mma wee bèé yagwoogwoo. Eleghị anya, ha chere na ọ nwụọla, tupu ha hapụzie ya n’ogbu ọbara. E mezịrị ka a marana e buruzịrị ya bụ nwa amadi dị ndụ wee gaba n’ụlọọgwụ ozigbo maka ilekọta yaanya na inye ya ọgwụgwọ. Ọ dị mwute na ndịagha ọlụọ ọlaa Bok