Blessing Chinenye David ga-ebupụta akwụkwọ/onyoonyoo na Febrụwarị 14
ORIAKỤ Blessing Chinenye David wuchara n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation, ndị na-emepụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa na SportsLight Xtra, banyere emume ọ na akwadebe. Emume ahụ bụ ibuputa akwụkwọ o dere ọhụrụ ‘Abuse of Right’/onyoonyoo (movie). Nke a ga-abụ n’abalị iri na anọ nke ọnwa Febrụwarị. Ọ bụ n’Annabel Cinema, Okpuno nke dị na ‘Fr Arazu Street’ mbanye ya dị n’okporoụzọ Obi Okoli Avenue site na ‘UNIZIK Tempsite, Awka na steeti Anambra. Ọ ga-amalite n’elekere abụọ nke ehihie. Oriakụ David kwuru na ya bụ emume bụ maka onye ọbụla, ọ kachasị ụmụaka nwoke, tinyere ụmụakwụkwọ, ndị nne na nna, ma bụrụ nke a ga-eji tikeeti a ga-agbata n’ebe ahụ wee bata n’ime ya. O kelere Sir Chuka Nnabuife ga-abụ onyeisioche mmemme ahụ tinyere ndị ANPC niile maka ọrụ ọma ha. O chefughị C. Don Adinuba bụ kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri oha na eze ihe ha kwesịrị ịma, Igwe Godwin Ezeilo na Nanka, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ. O kelekwara Dọkịnta Ifeanyichuk