Posts

Showing posts with the label Blọọkụ Rozịrị

Ndị Blọọkụ Rozịrị 'Aquinas Parish' Awka emeela emume icheta mbuli Maria dị asọ n'eluigwe

NDỊ otu Blọọkụ Rosịrị nke ụlọụka St Thomas Aqunias CatholicChurch, G.R.A, Awka, esorola ndị ụka Katọlik n’ụwa niile mee emume icheta mbugon’eluigwe nke Maria dị asọ,(feast of Assumption) na Satọdee ọnwa Ọgọstụ dịn’abalị iri na ise.   Ụkọchukwu ha(chaplain), Fada Blaise Ejike, onye kara ụka etiti ehihie kọwara na ụbọchị ahụbụ maka inye Chineke ekele ma sọpụrụ Maria dị asọ n’ọrụ ya na nzọpụta mmadụ.   O kwuru sị; “Nke anyere anyị olile anya na ndụ ụwa gachaa, anyị ga-abata n’otito nke eluigwe, ebenne anyị dị asọ nọ.”   Fada Ejike garan’ihu kwuo na ụka na-akụzi na nne dị asọ bụ nne nke Kristi ma rụtụ aka n’ekelenke Elizabeth, tinyere nke mmụọma Gabriel kelere ya n’akwụkwọ Luke isi nke mbụ;“Ekene Maria, I juputara na grasịa”.   Ọ kọwara na o nweghịnwaanyị ọ bụla nwetara ụdị ekele ahụ n’akwụkwọ nsọ niile, ma kwuo na ụka na-asọpụrụMaria dị asọ karịa ndị nsọ niile nke mere e ji akpọ ya Ezenwaanyị nke ndị nsọ.   Fada Ejike garan’ihu kwuwapụta uru rọsarị dị asọ bara ma kpọkuo ezinaụlọ ka ha jid