Posts

Showing posts with the label Bishop Okoye

Bishop Okoye agaa njem oziọma na Ekwulobia

ỤBỌCHỊ ụka ka nnukwu ụkọchukwu kwọrọ mmadụ otu narị na iri atọ aka n’isi ma gozie tabanakle n’ụlọụka St Anthony’s Catholic Church, Okpo Ekwulobia. Ọ bụ Most Rev Jonas Benson Okoye bụ osote bishọp ụka Katọlik na dayọsis Awka nọrọ n’isi ya bụ emume. N’okwuchukwu ya n’aja maasị, Bishop Okoye gwara ndị ahụ ọ kwọrọ aka n’isi (e duru n’okwukwe) na ọ bụ mgbe e tiri ha mmiri Chukwu ka ha ji bụrụ ndị otu Kristi, oriri dị asọ na-eme ka ha na-eto n’okwukwe, ebe ịkwọ aka n’isi ga-eme ka ha dịwanye ike. Ọ rụtụrụ aka n’akwụkwọ nsọ, Ndị Kọrenti nke abụọ; 11:19-23, nke kwuru sị “Taanụ onwe ụnụ ahụhụ iji banye site n’ụzọ dị warawara.” Ọ gara n’ihu kwuo sị “Paul tara ahụhụ; a pịara ya ụtalị, tinye ya n’ụlọ mkpọrọ, ọ fọrọ obere ihe ka mmiri rie ya, mana n’agbanyeghị ịdọ ya aka na ntị ndị a, ọ gara n’ihu na-agbasa oziọma.” O chetakwaara ha abụọma a gụrụ ka a gụchara ihe ọgụgụ nke mbụ “Gaanụ n’ụwa niile, gbasaanụ oziọma.” Bishop nọkwa n’ime aja maasị ahụ gọzie tabanakle, doo ya asọ ma donye oriri dị asọ (A