Posts

Showing posts with the label Bishop Okeke

Ozubulu: Bishop Okeke akatọọla ndọrọndọrọ n’ụlọụka, ịwakpo ndị ụka

BISHOP ụka Katọlik dayọsịs nke Nnewi, ‘Most Rev’ Hillary Okeke akwaala arịrị maka ịtụfu ọtụtụ ndụ nke dapụtara na mwakpo a wakporo ndị ụka na St Philip’s Catholic Church, Ozubulu na steeti Anambra n’afọ 2017.   Bishọp Okeke, onye kwuputara nke ahụ ka ọ na-edogharị ụlọụka ahụ asọ (re-dedication) dịka a rụgharịchara ya kpọkuru ndị otu Kraist ka ha na-asopụrụ adịmasọ nke ụlọụka ahụ dịka nke nwere ikike na nchekwa Chukwu.   O kwuru sị na Kraist gosipụtara ịhụnanya, ma kpọkuo ndị mmadụ ka ha na-ahụrịta ibe ha n’anya dịka ọ rụtụrụ aka na ịhụnanya n’ebe mmadụ na ibe ya nọ bụ ihe mere ka okpukpere Kraist dị iche n’ebe okpukperechi ndị ọzọ nọ.   Ọ kwuru sị na dịka ọ bụ ụlọnsọ Chineke, o kwesịrị ka a na-ahụ ya dịka ebe ndị kwere ekwe na-ekpe ekpere, ọbụghị ebe a na-eme ndọrọndọrọ  (politics). Ya mere, ọ dọrọ aka na ntị maka iji ụlọụka eme ihe ndị na-anaghị enye Chineke otito.   O kelere Aloysius Ikegwuonu, onye Ozubulu rụrụ ụlọụka ahụ, tinyere mmeso ọma ya n’ebe ndị mmadụ nọ.   N’akụkụ nke ya, I