Anambra etoola Bishọp Okeke ka ọ na-ala ezumike
STEETI Anambra etoola Bishọp ụka Katọlik Dayọsis Nnewi, ‘Most Rev. Dr.’ Hilary Paul Odili Okeke, onye lara ezumike dịka bishọp dayọsis ahụ na ngwụcha izuụka, ka ọ gbara afọ iri asaa na ise, nke bu afọ iwu ụka kwuru. Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri ọha na eze ihe ha kwesịrị ịma, C. Don Adinuba kwuru n’ozi ya n’Awka, isi steeti ahụ sị: “Ọrụ Bishọp Okeke dịka onye ndu nke Dayọsis Nnewi kemgbe afọ iri abụọ na otu abụghị ihe ọzọ karịa nke juputara na mkpali mmụọ na ihe ilegara anya. Aka Chukwu Mụọnsọ ga-adịrịrị na nhọpụta a họpụtara ya ka bishọp mbụ nke dayọsis ahụ e kepụtara ọhụrụ, n’ihi na o bugoro dayọsis ahụ n’ogo dị elu na ngakaba ọbụla, n’obere oge.” Kọmishọna Adinuba toro Bishọp Okeke ma kwuo na ọbụghị sọọsọ na ọ kpara ike n’ilekọta ụka a hanyere ya n’aka, kama na ọ gara n’ihu rụọ ụlọọgwụ, ụlọahụike bụga ịgba ma tinyekwara ime onwe ya mmụọọma nke udo na ọganihu. O toro bishọp ahụ maka umeala na ịgba mbọ ịrụ ọrụ niile e nyere ya kemgbe e chiri ya ụkọchukwu ka ọnwa Epure