Bishọp Ezeokafor eriela ji ọhụrụ n’Awka
ONYEISI nchụaja ụka Katọlik na dayọsis Awka, bụ Bishọp Paulinus Ezeokafor nọrọ ụbọchị Tuzdee wee merùbé mmemme iri ji ọhụụ ya nke ahọ 2022. Ya bụ mmemme dara ụda bụ nke e mere n’ụlọuka St. Patrick’s Cathedral dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke dọtara ọtụtụ ndị ọrụ ụka sitere ebe dị icheiche n’ime dayọsis ahụ wee bịa. N’okwu ya oge o kpechara ekpere, gọzie, waa ma surukwa ji ọhụụ nke ya, rie na mmemme ahụ; Bishọp Ezeokafor kọwàrà ji dịka eze nke ihe a kọ̀rọ̀ n’ugbo, ma kelekwazie Chineke maka ndụ, ngọzi, nchekwa na ahụike o nyere ha, ha wee merùbé mmemme iri ji ọhụrụ nke ahọ a. O kelèkwàra Chineke maka otu o siri gọzie ala na ihe omume ya ma gọzikwa ndị ọrụ ugbo, ha wee kọ̀ọ́ ma gwute n’ùjú. Ya bụ onyeisi nchụaja, Bishọp Ezeokafor, gàkwàrà n’ihu kọwaa mmemme iri ji ọhụrụ dịka nnukwu mmemme na omenala pụrụ iche e ji mara ndị Igbo; ma kọwakwa ya dịka oge inye Chineke ekele. O kọwàkwazịrị na o nweghị ihe ọbụla dị njọ ọ hụtara ná mmadụ imerubè omenala ya, dịka mm