Posts

Showing posts with the label Bishọọpụ Ezeofor

Bishọọpụ Ezeofor adụọla ndị mmadụ ka ha kwụsị ịgba ọsọ n'iso Kraịst

 A KPỌKUOLA ma dụọ ndị ụka ka ha kwụsị inye mkpesa enweghị isi na ọdụ n’ihe banyere iso ụzọ Kraịstị na ijere Ya ozi oge ọbụla a kpọrọ ha.   Bishọọpụ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Agụata, bụ Bishọọpụ Samuel Ezeofor bụ ya nyere ndụmọdụ a n’okwuchukwu ya n’ofùfè nrò ịkwọ aka n’isi nà ịkpọbàtá ndị mmadụ n’òtù dị iche-iche, bụ nke ọ gara mee na nsonso a n’ụlọụka ‘St. Peters Church Lomu Umunze’ dị n’okpuru ọchịchị ‘Orumba South’ nke steeti Anambra.   Dịka ọ na-akọwa iso ụzọ Kraịstị dịka ihe dị oke mkpa maka onye ọbụla chọrọ ịbà alaeze Chineke, ọ kpọkuru ndị ka na-agba ọsọ n’iso ụzọ Kraịstị n’ihi otu ihe maọbụ nke ọzọ ma dụọ ha ọdụ ka ha gharakwa ikwe ka ihe ọbụla gbochie maọbụ dọghachi ha azụ n’iso ụzọ Kraịstị, bụkwa nke mmadụ apụghị ime ma ọ bụrụ na onye ahụ ebughị ụzọ nabata Chineke dịka onye nwe ya na onye nzọpụta ya.   O kwuru na Kraịstị bụ Ọkpara Chineke O zitere n’ụwa maka ịzọpụta ụwa na mmehie na iwetere mmadụ ntọpụ n’agbụ, ọbụladị dịka o chetaara ndị na-agba ọsọ n’iso ụzọ Kraịstị, ije o

Bishọọpụ Ezeofor agbapeela ogige ụlọekpere a rụrụọhụrụ n'Umuchu

BISHỌỌPỤ ụka Angịlịkan na dayọsiisi Agụata, bụ Bishọọpụ Samuel Ezeofor emeela mmemme ịgbapegharị ótù ogige ụlọekpere a rụzigharịrị ọhụrụ na dayọsiisi ahụ.   Ya bụ ogige bụ nke a maara dịka ‘Catechist Gabriel Ezekwo Memorial Chapel And Umuchu Unity Centre’ ma bụrụkwa nke dị n’ụlọụka ‘St. Thomas Anglican Church, Umuchu’, n’okpuru ọchịchị ime obodo Agụata, nke steeti Anambra.   N’okwuchukwu ya n’ofufè nrò pụrụ iche e jiri malite mmemme ahụ, Bishọọpụ Ezeofor, ónyé nyere nkọwa banyere ògigè ahụ, chetaara ndị sonyere na mmemme ahụ mkpà ọ dị mmadụ ịmara Chineke na mmadụ iji ndụ ya na obi ya niile jeere Chineke ozi n’ụwa, ka aha ya wee bàá n’akwụkwọ nke ndụ, nke na  eluigwe na ụwa ga na-agbara ya akaebe maka ezi ndụ o biri, ọbụladị oge onye ahụ hapụrụ ụwa.   Dịka ọ na-eme ka a mara na ogige ahụ bụ nke a rụrụ n’aha onyenkụzi ụka/Katikiisti mbụ nọrọ n’ụlọụka ahụ, bụ Maazị Gabriel Ezekwo, iji kwanyere ya ùgwù ma mekwa ka aha ya dị ọkpụtọrọkpụ; Bishọọpụ Ezeọfọr kpọkukwàzịrị ọhaneze bịara mmemme ah