Ochanya Ogbanje: Ọnwụ obere nwata nwaanyị a e metọrọ bunye ọya akpasuela ndị Benue iwe
IGWE mmadụ ọnụma juru obi na-egosipụta iwe ha site n’ime ngaghari ịwe maka onwụ nwata nwanyị gbara afọ iri na atọ bụ Ochanya Elizabeth Ogbanje, bụ onye zutere ọnwụ ya n’oge erughị eru n’ihi mmetọ na ndakpo nke si n’aka otu nwoke aha ya bụ Andrew Ogbuja na nwa ya nwoke, Victor. Ochanya Ogbanje,onye e liri ozu ya abali ole na ole gara aga bụ nwata akwụkwọ na Federal Government Girl’s College, Ugbokolo na Steeti Benue. Ọ bụ mgbe ọ dị afọ asato ka e bidọrọ na-emetọ ya ma na-akwa ya ịkọ n’ike aghara aghara nke kpataara ya ọrịa ojọọ nke a kpọrọ ‘Vesico-vaginal fistula (VVW) ka ọ gbara afọ ịrị na atọ. Ndị mere arụ ahụ bụ Andrew Oguja, onye nkuzi dị afọ iri ise ji okwa dika onye isi ngalaba ihe omumụ ‘Catering and Hotel Management, Benue State Polytechnic’, ma bụrụkwa onye agha nke okwukwe ‘knight’ n’ụka Katolic na nwa ya nwoke bụ Victor, onye nọ n’afọ nke ikpeazụ na ‘Federal University of Agriculture, Makurdi. Dịka nwata nwayị ahụ lara mmụọ si kwu, ọ bụ Victor bụ onye mbụ metọrọ ya, ma mgbe