Posts

Showing posts with the label Benue

Na Benue, Fada enwetela mmeri iji aha APC zọọ ọkwa Gọvanọ

ỤKỌCHUKWU ụka katọlik dayọsis Gboko, nke dị na steeti Benue, Fada Hyacinth Alia enwetela mmeri iji aha otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressive Congres (APC) wee zọọ ọkwa gọvanọ na steeti Benue.   Fada ahụ ka e kwuru na o meriri ndị ya na ha zọrọ ya bụ ọkwa, ndị gụnyere, Banabas Gemade, jibu ọkwa onyeisioche PDP n’ala Nigeria na Mike Aondoakaa, jibu ọkwa ‘Attorney General of the Federation’.   O nwetara vootu karịrị puku asaa, ebe ụfọdụ ndị ya na ha zọrọ ọkwa enwetaghị ọbụladị otu vootu n’ụfọdụ okpuruọchịchị ime obodo.   Fada Alia kwuru oge ọ banyere ndọrọndọrọ ọchịchị na ihe kpaliri mmụọ ya bụ ka ya zọpụta steeti Benue, ma kọwaa na site mgbe ahụ o kpebiri ịza oku ndị nke ya, na o doro ya anya aja chere ya n’ihu, ọ ga-achụ.   Ọ dị ncheta na Bishop dayọsis Gboko, Most Rev. William Avenya nyere Fada Alia ocheazụ maka ịbanye n’ígwù okwe ndọrọndọrọ ọchịchị na isonye n’ịzọ ọkwa gọvanọ na steeti Benue, nke a ga-eme na 2023. Ka ọ dị ugbua, ọ gaghị na-arụziri ndị mmadụ ọrụ ụkọchukwu n’ihi ocheaz

E gbuola onyeamụma asịrị na o ji ịnapụ ụmụnwoke amụ akpa ego na Benue

ỤFỌDỤ ndịntorobịa iwe na-ewe egbuola otu onyeisi ụka aha ya bụ ‘Prophet’ Uhembe Jacob, nke ụlọụka ‘Divine Shadow Church’ n’ihi na ọ dị ka aka ya ọ dị n’amụ ụmụnwoke nke malitere ifu aghara aghara na mba Daudu nke dị n’okpuru ọchịchị Guma na steeti Benue.   Ndị obodo ahụ gara n’ihu gbaa ụlọụka ahụ ya na ụlọ ndị ọzọ Uhembe nwe, tinyekwa ụlọ nke onye ọzọ e kwuru na aka ya dị n’arụ ahụ nwe.   Uhembe, onye hibere (founder) ụlọụka ahụ  n’onwe ya ka ndị bi n’ogbe ahụ kwuru na ọ na-anapụ onye ọbụla amụ ya na-efu efu narị puku naịra na ụma iri abụọ (N120,000) tupu o mee onye ahụ, ka amụ ya chigha azụ.   Ndị nọ oge o mere kwuru na onyeisi ụka ahụ egburu egbu gbara mbọ ka ọ agbapụ gbalaa steeti Nasarawa bụ agbataobi ha mana ndịntorobịa ahụ jidere ya gbuo ma likwaa ya.   Ka ihe a mechara, ndị ụka ya jiri foto (posters) ya mee ngaghariiwe kwuo na ha chọrọ ikpemkwụmọtọ banyere ya.   Onye na-ahụ maka ọdị mma ndị mmadụ na ndị uweojii na steeti Benue, Catherine Anene kọwara n’ozi ya na e gburu onyeamụm

Na Benue, nwata afọ iri a dakporo n'ike amụọla nwa

NWA afọ iri a dakporo n’ike na steeti Benue amụọla nwa nwaanyị. Nwata nwaanyị ahụ aha ya bụ Masenengen enweghịzị nne na nna n’ihi na ha alaala mmụọ. Ọ bụ mgbe o so otu nwanne ha (uncle) wee gbapụ n’obodo ha dị n’okpuru ọchịchị Guma wee gbaga ọsọndụ na Makurdi ka ndị Fulani wakpochara obodo ahụ, ka otu nwoke amaghị onye ọ bụ dakporo ya n’ike wee tụba ya ime. Ime mere nwata ahụ abali atọ tupu nwanne ha ahụ were kpọga ya ụlọọgwụ General Hospital North Bank, Makurdi. Ọ bụzi ka otu onye o metụrụ n’obi tinyere ihe banyere ya n’ihe ọgbara ọhụrụ ‘social media’, ka Ukan Kurugh bụ onye na-arụ ọrụ ebere ‘humanitarian activist’ na ndị otu ya ndị ọzọ matara maka ya wee kpọga ya na Foundation Hospital Makurdi ebe a nọ waa ya afọ wee kuputa nwa n’udo. Ka ọ dị ugbu a, ndị mmadụ si n’ugwu na ndịda na-abịa n’ụlọọgwụ ahụ ka ha hu obere nwa ahụ bụzi nne, na nwa ya ọ mụrụ ọhụrụ, ma na-ewetakwa ihe onyinye dị iche iche iji nyere ha aka. Onye nchịkọba (National Coordinator) Jireh Doo Foundation n’ala anyị bụ