NDLEA anwụchikọọla onye ọrụ nchekwa adịgboroja si Benin Republic ebubata ọgwụ na Nigeria
NDỊ ọrụ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchikọọla otu nwoke aha ya bụ Basiru Ibrahim onye nke a kọwara na ọ bụ ‘onye ọrụ nchekwa adịgboroja’, maka isi mba Benin Republic na-ebubata ọgwụ na Nigeria. Okwuputa okwu NDLEA bụ Femi Babafemi kwuputara nke a n’izuụka gara aga. Ibrahim onye nke kọwara onwe ya ka onye ọrụ dị elu na ‘law enforcement agency’ kọmandị Sokoto bụ onye nke a nwụchikọrọ na steeti Kebbi dịka a chọpụtara na o ji ‘skunk’. Babafemi kwuru na a nwụchikọrọ Ibrahim onye nke gbara afọ iri atọ na asatọ n’ebe nnyocha ụgbọala na-aga n’okporoụzọ (checkpoint) ka o ji ụgbọala ya buru ọgwụ ndị ahụ. Ozi ahụ tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ kwuru sị: “Onye a na-enyo enyo na ọ bụ onye ọrụ nchekwa adịgboroja Basiru Ibrahim, onye nke ọrụ ya bụ ibufete ọgwu ọjọọ na Benin Republic site Lagos ruo steeti Sokoto ka a nwụchikọrọ ka o bu skunk dị 280-kilogram na Diazepam na steeti Northwest.” Mgbe a na-agba ya ajụjụ, nwoke ahụ a nwụchikọrọ kwuputara na ya dịla na mbụ bufetere otu