Bayelsa anwụkọọla ehi 44 tara ahịhịa ebe ekwesịghị
GỌỌMENTI steeti Bayelsa ebuola agha megide ịda iwu na-echekwa otu ehi si akpagharị na-ata ahịhịa na steeti ahụ nke a kpọrọ Anti-Open Grazing Law. N’ihi ọnọdụ ahụ, a nwụchikọọla ehi dị iri anọ na anọ n’ọnụọgụ bụ ndị a hụrụ ka ha na-ata ahịhịa n’ogologo ụzọ Imiringi dị n’okpuru ọchịchị Ogbia na steeti ahụ. Gọvanọ Douye Diri nọ na Maachị 10, 2021 binye aka ma mee ka ọ bụrụ iwu ‘Anti-open Grazing Law’ nke a maara ka Livestock Breeding, Rearing and Marketing Regulation Law. Ọ kwụbakwara kọmiti na-ahụ banyere ya nke kọmishọna na-ahụ maka ọrụugbo, Maazị David Alagoa nọ n’isi ya, tinyere ndị ọzọ a họpụtara site ọrụ nchekwa dị iche iche. Otu o sila dị, ọtụtụ ndị ọrụugbo n’Imiringa, Elebele na Emeyal dịcha n’ọkpuru ọchịchị Ogbia tinyere Tombia na Okutukutu dị n’okpuru ọchịchị Yenagoa eteela ha ji enye mkpesa banyere otu ehi si emebicha ihe ha kọrọ n’ugbo n’agbanyeghị iwu ahụ e hibere. Ndị ọrụugbo ahụ enyela mkpesa n’Alagoa, tinyere ndị ọrụ gbanụgbanụ (task force) steeti ahụ, ka ha nye