Posts

Showing posts with the label Bịshọpụ Katọlịkị

E meerela ndị fada mere okenye Isita

… Buputa efere ukwe otu n’ime ha hibere na ’70’s’ NA FRAIDEE na-eso Isita ọnwa Epure dị n’abalị iteghete ka a nọ na Priests Welfare Home nke dayọsis Awka wee meere ndị okenye fada bi n’ebe ahụ emume ọńụ Isita. Priests Welfare Home bụ ebe obibi ndị fada merela agadị lara ezumike nka na ndị nwere nsogbu nke na ha agaghị enwezi ike ịrụ ọrụ na-ebi.   Emume ahu nke Valentine Chineto Ozigbo kwadoro dara ụda ma bụrụkwa ihe ọńụ n’ihi na a nọ na ya buputa ukwe ndị Fada Simon Azuka chịkọbara mgbe a nọ n’afọ ’70’s’. Ọ bụ odeakwụkwọ (Principal Secretary) Gọvanọ Willie Obiano aka na-achị steeti Anambra bụ Willie Nwokoye kwadoro ma buputa ukwe ahụ nke a haziri n’efere egwu abụọ.   Na mmalite aja maasị, bịshọp nọrọ n’isi emume bụ Most Rev. Peter Okpaleke nke Ekwulobia dayọsis kọwara na emume ahụ bụ emume ịhụnanya, na mmetụta.   N’okwuchukwu ya, Bịshọp Paulinus Ezeokafor nke dayọsis Awka site n’ihe ọgụgụ a gụrụ n’Akwụkwọ Nsọ kọwara na mbilite n’ọnwụ na-agba mmadụ ume.   O kwuru sị: “N’ọnọdụ ọbụla ị hụ

Bịshọpụ Katọlịkị eyinyela mmadu iri na asaa na-achọ ichi ụkọchukwu akwa ọcha n’Awka

A NỌ na Holy Family Spiritual Year Seminary, Okpuno, nke di n’okpuru ọchịchị Awka South na nso nso a wee yinye ụmụokorobia iri na asaa na-achọ ichi fada akwa ọcha. A kporo nke a ‘2018 Investiture’. Dika o si dị, emume ahụ bụ ome n’afọ nke a na-eme n’ụlọakwukwọ ahụ. N’okwuchukwu ya n’aja maasi dị asọ; bishọpụ ụka katolik nke Awka dayọsis bụ ‘Most Rev’ P.C. Ezeokafor gwara ha ka ha kee ajị n’ụme wee nabata ọzụzụ a na-enye ha. O kwuru sị na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị e jị echeta itụ ime Marịa di asọ n’ejighị njọ ọbụla. Ọ dụrụ ha ọdụ ka ha nabata ọzụzụ nke a na-enye ha maka ịbu ụkọchukwu dika Maria si nabata ịbụ nne nke Chukwu.  Ọ gwara ha sị: “Onye mekata ihe ọma, ahụ ya abụrụ ihe ọma. A na-ebido n’oge ebi ezigbo ndụ makana anaghi amụ aka ekpe na nka. Onye ga-abụ fada ga-abụ ezigbo mmadu n’ihi na onye isi anaghị edu onye isi. Ọ dị mma ka mmadụ yie aha a gụrụ ya”. Bishọpụ Ezeokafor gakwara n’ihu gwa ha ka ha jiri oge a kpọrọ ihe na ihe ndị uka chọrọ n’aka ụkọchukwu bụ okwu nke Chineke na sakaram