Popu Francis ahọpụtala Bịshọọpụ Kukah ka o soro na kansụl na-ahụ maka ọdịmma ndị mmadụ
POPE Francis ahọpụtara Most Rev. Matthew Hassan Kukah bụ bishọp nke dayọsis Sokoto ka o sonye n’otu na-ahụ maka ọdị mma ụmụ mmadụ, Vatican Council on human rights, justice and development. Ụkọchukwu na-ahụ maka mgbasaozi na dayọsis Sokoto bụ Fada Chris Omotosho kwuputara nke a n’ozi ya site na Catholic Secretariat of Nigeria, Abuja. Ọ kọwara nhọpụta a e nyere Bishop Kukah dịka ezi ihe nke ga-eweta ọganihu n’ebe ndị nke Chineke nọ, ọ kachasi ndị na-aga ụka Katọlik na Nigeria. Ozi ahụ, tinyere ọtụtụ ihe ndị ọzọ kwuru sị: “Site na nhọpụta a, Bishop Kukah ga-esonyere ndị ọzọ sọ na kansụl ahụ bụ ndị sị na mpaghara ụwa dị iche iche na-enye ndụmọdụ ma na-akwalite mmetụta Pope n’ihe gbasara ikpemkwumọtọ, udo, ikike dịịrị mmadụ, mmegbu, ịtụ mgbere mmadụ, nlekọta nke ihe e kere eke na ihe ndị ọzọ metụtara ịkwalite ugwu dịịrị mmadụ na mmepe. Nhọpụta a bụ nke a na-emenwogharị (renewable), bụ maka afọ ise na mmalite. A ga-ehibe kansụl ahụ n’oge a ga-ewepụta. Nhọpụta ahụ bụ nke His Eminence,