Posts

Showing posts with the label Azịa

E liela Pa Okoye n'Azia

E MEELA mmemme akwamozu Ichie Chisata Simon Okoye n’obodo yadị n’Umudiokpara, Azia nke dị n’okpuru ọchịchị Ihiala, na steeti Anambra. Ya bụagụ nwoke bụ onye gbara ahọ iri asaa na abụọ. Maazị Okoye lụrụ nwunye ya bụLolo Christiana Uzochukwu Okoye, ma Chineke jiri ọmarịcha ụmụ asatọ wee gọzieha.   Ọ rụrụ ọrụ dịkannukwu onye enyemaka n’ihe gbasara ‘Infrastructural Development and Urban WaterProject’ n’oge Chinwoke Mbadinuju bụ Gọvanọ steeti Anambra n’oge gara aga.   Ọ rụkwara ọrụ dịkaonyeisi ụlọọrụ Niger Chemical Paint Manufacturing Company n’Ogbaru, n’imesteeti Anambra, tinyekwara ọtụtụ ọkwa dị iche iche o jiri, ma n’ụlọ ụka Katọlikn’ọchịchị obodo ya, na ebe ndị ọzọ.   N’ozi nkasiobi ya,onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra Newspaper and Printing Corporation (ANPC), Maazị ChukaNnabuife, onye du ndi ụlọọrụ ya wee gaa akwamozu gwara ezinụlọ Maazi Okoye kaha ruo uju dịka ndị nwere olileanya n’ime Chineke. Ọ gara n’ihu kwuo na ọ bụmaka nwa ha nwoke bụ otu onye n’ime ndị na-arụ n’ụlọọrụ ahụ, bụ ASC Johnpau

A ga-etecha ụzọ Isekke-Mbọsị-Azịa-Ụkpọr tupu udú Mmiri – Obianọ

GỌỌMEENTI steeti Anambra emeela ka a mara na ya ga-etecha okporo ụzọ ahụ siri Isekke gaa Mbọsị gaa Azịa wee pụta Ụkpọr tupuu oge udu mmiri eruo n’ahọ a. Gọvanọ Willie Obianọ, bụ aka na-achị steeti ahụ mere ka a mara nke a oge ọ gara ịmara ka ọrụ si aga na ya bụ okporo ụzọ, bụ nke o sikwara na ya wee ga gbapee mmiri a gbapùrù site n’aka Maazị Paschal Agbọdike, bụ onye na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo Ihiala nke abụọ n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu steeti ahụ. O kọwara ya bụ ụzọ dịka nke ga-eweta mmepe ma mekwa ka ihe dịrị ndị bi na mpaghara ahụ mfe ma ọ bụrụ na a rụchaa ya. Ọ kpọkùzịkwara ndị mpaghara ahụ ka ha gaa n’ihu ịkwàdò otu ndọrọ ndọrọ APGA, iji wee gaa n’ihu n’ọrụ ọma dị ihe iche na-ewere ọnọdụ ugbu a. N’okwu nke ya, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ na steeti ahụ, bụ Maazị Marcel Ifejiọfọr kwuru na a na-etinye uchu nke ukwuu na ya bụ ọrụ na ọrụ ngo ndị ọzọ e ji n’aka ugbu a, ma kwuo na a ga arụchapụ ya bụ ọrụ n’oge a tụrụ anya ya. Onye ji ya bụ ọrụ ngo, bụ Maazị Philip Eyisi, n’okwu nke ya, me