A kpụpụla otu nwoke ụlọikpe maka ikwaso ezi iko
ÒA Kpụpụla ma kpụgharịa otu nwoke aha ya bụ Ayokunbi Olaniyin’otu ụlọikpe Majie dị n’Ibadan n’ime steeti Ọyọ, maka ịkwaso ezi mmadụ ikon’ike. Ya bụ nwoke, bụ onyegbara ahọ iri abụọ na abụọ, ka e kwuru na o bì na mpaghara Eleti–Odo, dị n’ụzọIwo, n’Ibadan, ma bụrụkwa onye ọ bụ ndị uweojii kpụpụrụ ya ụlọikpe ahụ maka arụrụalaahụ ọ rụrụ. Akụkọ kọrọ na nwoke ahụ na-arụ ọrụ n’ebe a na-azụ ezi dịn’otu ụlọ anụmanụ dị na mpaghara Elewi–Odo. Mana ka o sila dị, oge ihe o jiri bụrụnwoke selitere isi wee na-achọgharịzị ihe ọ ga-eri, o jiri nwayọ kpọrọ otu nneezi mara abụba n’ebe ahụ, kpazuga ya n’otu akụkụ, wee mazụrịa ya ebe ahụ. Ọ bụzịoge Maazị Ọlaniyi na-eri ezi ahụ ọkọmbọ ma na-achọkwa ka ọ laa ya n’iyi, ka akakpààrà ya; e wee nwụchikọọ ya, ma kpụpụ ya ụlọikpe. Onye kpụpụrụ nwa amadi ahụ ụlọikpe n’aha ndị uweojii, bụMaazị Opeyemi Olagunju kọwara na ihe ahụ nwoke ahụ mere bụ nsọala ma bụrụkwanke megidere ihe ịdị ka chi siri kèé ya. Ọ gakwara n’ihu kọwaa na arụrụala ahụmègidere ihe mpaghara 214