Ọkụ gbara n'Assumpta Cathedral, Owerri emebighị nnukwu ihe – Onye nọ ka o mere
ỌKỤ ọgbụgba gbara n’obi Chukwu Maria Assumpta Cathedral, nke Katolik Achịdayọsis n’Owerri steeti Imo. Otu onye nọ ka ya bụ ihe mere gwara ndị ntaakụkọ na ya bụ ọkụ ọgbụgba malitere mgbe ọ foro ihe dịka nkeji iri na abụọ ka ọ buru etiti abalị (ndeeri), ma bụrụ nke metụtara otu mpaghara nnukwu ụlọụka ahụ. N’okwu nke ya, otu ụkọchukwu achọghị ka a kpọọ aha ya kọwara na ọ bụ akọrọngwa latrịịk kpatara ọkụ ọgbụgba nnukwu. Ọ bụ n’ihi nsogbu latrịịk. Ọ malitere site n’otu ọnụụlọ n’ụlọụka ahụ ebe e nwere ọtụtụ ihe. Onweghị mgbe ọkụ ga-agba ghara imebi ihe. Site n’amara Chineke, ọkụ ọgbụgba ahụ agaghị n’ihu, site n’enyemaka ndị ọzọ, e menyụrụ ya. Ya mere, ọ bụ sọọsọ nsogbu latrik.” Otu onye n’ime ndị soro menyụ ọkụ ahụ kwuru sị: “Oge ọkụ ahụ malitere gbaba, anyị nụrụ ihe mbigbo. Site na mpaghara ahụ, waya latrịịk malitere na-ekegasi ọkụ, ọkụ ọgbụgba sochie ya ozigbo. Ọ ga-abụ akọrọngwa eletrọniik na ngwa egwu dị na mpaghara ụlọụka ahụ. Anyị na-ekele Chineke na ọgbaghị nnukwu.” Ọ gakwara