A kọwaala akwụkwọ ka ụzọ mmadụ si aghọta ntọala obodo
OTU jikọtara ndị na-ede akwụkwọ, Association of Nigerian Authors (ANA); (otu mpaghara ya) mere emume zuzugbe ome n’afọ ha, agba nke iri atọ na iteghete n’Awka isiobodo steeti Anambra n’izuụka gara aga; nke were ọtụtụ ụbọchị. Ha nọ n’ọgbakọ ahụ nke kpọkọtara ọtụtụ ndị otu ahụ sitere na steeti dị iche hazie ma lebaa anya n’ọtụtụ isi okwu. Onyeisioche mmemme ụbọchị Fraidee ọnwa Disemba dị n’abalị iri na otu bụ Barr G. N. Orji nabatara ndị mmadụ niile si mpaghara Nigeria dị iche iche wee bịa ma too onye hibere emume ahụ bụ Ọkammụta Ngozi Chinwude dịka onye gbasiri ike na-eme ka ihe na-aga aga. Oriakụ Dọkịnta Ebelechukwu Obiano (Osodieme) onye nke Oriakụ Chioma Unachukwu nọchitere anya ya nyere ndị otu ahụ nkwado ya. N’okwu ya, Chioma Unachukwu gwara ndị abụghị ndị Igbo sị na Osideme pụtara nwaanyị na-eso di ya eme ihe dị mma ma kọwaara ọha na eze na a maara Oriakụ Obiano maka ọrụ ọma ya, tinyere na o nwere ihe ọ hibere (NGO) nke ọ na-esi na ya enyere ụmụ ogbenye aka. Ọ gwara ha sị: