N'Awka, Ashbishọp Ibezim Ebikwasala Mmadụ 54 aka n'isi, nabata mmadụ 49 n'òtù ụmụnwaanyị na òtù ụmụnwoke
A DỤỌLA ndị otu Kraịst ọdụ ka ha bie ndụ ịdị ọcha na ịdị nsọ, n’agbanyeghị ihe dị icheiche na-emegasị na gburugburu ha na n’ebe ọbụla ha hụtara onwe ha. Ashbishọp nke mpaghara Niger ma bụrụkwa Bishọp nke Dayọsis Awka, bụ Most Reverend’ Alexander Chibuzor Ibezim bụ ya nyere ndụmọdụ a n’okwuchukwu ya na mmemme ofufenrò ibikwàsa aka n’isi ikpeazụ ya n’ime afọ 2021, nke e mere n’ụlọụka ‘Chapel of Redemption’ nke Mahadum Nnamdi Azikiwe, dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra. Ya bụ ofufènrò wééré ọnọdụ ụbọchị Tuzdee, bụ nke ọtụtụ ndị mmadụ sonyere na ya, ma bụrụkwa nke Ashbishọp Ibezim nọrọ na ya wee bikwàsa mmadụ 54 aka n’isi, nabàta ụmụnwoke ruru iri abụọ na otu n’ọnụọgụgụ n’otu ụmụnwoke dayọsis ahụ, nabàtakwa ụmụnwaanyị ruru iri abụọ na asatọ n’otu ụmụnwaanyị dayọsis ahụ, bụ ndị sitere ụlọụka ‘Anglican Church of Redemption Parish, Awka’ na ụlọụka ‘Chapel of Redemption, UNIZIk, Awka’. N’okwuchukwu ya n’ebe ahụ, Ashbishọp Ibezim, onye okwuchukwu ya gbadoro ụkwụ n’ịdị ọcha, kọwara ịdị ọcha