Ọba akwụkwọ Anambra emeela emume asụsụ Igbo gà-adịgide nke 2021
MMEMME Asụsụ Igbo Gà-adịgide nke ahọ 2021 abịala na njedobe n’Awka, bụ isi obodo steeti Anambra, dịka ndị ọnụ na-eru n’okwu kpọkùrù ndị Igbo ka ha na-akwàdo ma na-akwalite asụsụ na omenala Igbo. Mmemme omenahọ ahụ, nke ọ bụ Ọba Akwụkwọ Anambra na-achịkọba, dọtàrà imirikiti ndị ihe gbasaara asụsụ na omenala Igbo na-amasị, ndị nkụzi, ndị nọ na ngalaba mmụta, ndị ọrụ gọọmenti, ndị e ji okwu ha agba izu ‘n ala Igbo, tinyere ụmụakwụkwọ sitere mpaghara ebe dị icheiche na steeti Anambra. Na nkụzi o nyere na mmemme ahụ, Ọkammụta Nkechinyere Nwokoye nke mahadum Nnamdị Azikiwe dị n’Ọka (Awka) kpọpụtasịrị ihe dị icheiche o mepụtàgòrò, ogoogo o rugoro na ebe dị icheiche o jegoro n’ihi asụsụ Igbo, ma kpọkuo ndị na-echè na o nweghị uru asụsụ Igbo bara maọbụ ebe e ji ya eje, ka ha kwụsị ichè ụdị echiche dị etu ahụ, n’ihi na uru dị n’asụsụ Igbo bụ ‘agụkata agba awaa’. Ka ọ na-akatọ amụmá ahụ ndị òtù mba ụwa UNESCO buru sị na asụsụ Igbo ga-anwụ maọbụ fuo n’oge adịghị anya, Ọkammụta Nwokoye kwupụtara ez