Posts

Showing posts with the label Asụsụ

Asụsụ

Victor Maduagwuna   ASỤSỤ bụ ụzọ mmadụ na ibe ya si emekọrita. Ọ bụ site n’asụsụ ka ndị mmadụ si akọwa onwe ha.   Asụsụ na-eme ka ebumnuche ndị mmadụ pụta ihe. Ọ bụ site n’asụsụ ka e si aghọta ihe ndị mmadụ bu n’uche. Asụsụ na-eme ka a amata ebe mmadụ si na onye mmadụ bụ. Asụsụ bụ okwu mmadụ na-ekwu n’ọnụ. Ọ bụ olu ka e ji asụ asụsụ. Ọ bụ ya mere na e nwere ike ịsị na asụsụ bụ ụdaolu mana ọ bụghị ụda ọbụla e mepụtara nwere nghọta. Ọ bụrụ na onye si mba ọzọ na-ekwu okwu n’asụsụ ya n’ebe ndị anaghị anụ asụsụ ya nọ, ha ga-anụ ụda si n’ọnụ ya pụta mana ha agaghị aghọta ihe ọ na-ekwu. Ha nwere ike ịsị na onye ahụ na-eme mkpọtụ makana ha aghọtaghị ihe onye ahụ na-ekwu. E nwere ike ịsị na asụsụ bụ ụdaolu nwere nghọta nke ndị mmadụ ji emekọrita ma ọ bụ akpakọrita ụka mana nke a ga-abụ n’etiti ndị nwe asụsụ ahụ ma ọ bụ ndị maara asụ asụsụ ahụ, ma ọ bụ ndị na-aghọta ya. Asụsụ dị n’ụwa bara ụba otu ndị nọ n’ụwa siri ba ụba. E nwere asụsụ bekee nke a na-akpọ ‘English’. E nwekwara ọtụtụ asụsụ ndị ọ