Otu a ga-esi gbochie mpụ na ụrụala
MPỤ na arụrụala bụ okwu akpụ n’ọnụ n’oge dị ugbu a. Ihe akwụkwọ nsọ kwuru n’akwụkwọ Timoti nke abụọ isi nke atọ, amaokwu nke mbụ wee ruo na nke ise (2 Timothy chapter 3: 1-5) mgbe ikpeazụ ahụ bụkwa ugbu a. Ihe arụ dị iche iche dịka nwanne igbu nwanne ya, nwa igbu nne na nna ya, izu ohi, nna idina nwa ya, igbu mmadụ, ịtọrọ mmadụ nara ego ma gbuo onye ahụ, iji mmadụ chụọ aja dị iche iche, ịmago nwaanyị elu n’ike, iji aghụghọ nara mmadụ ihe ya, ego maọbụ ala nakwa ihe ndi ọzọ, nwoke ime onwe ya ka nwaanyị. Oge ụfọdụ ị nụ maka ndị na-akpa nsị na ndị na-ata amosu na-egbochi ọganihu ndị mmadụ. Ihe arụ ndị a na ndị ọzọ akpọghị aha ha ebe a bụkwa ihe na-eme n’oge a. E kwuchaa ihe ndị a niile ma ekwughị otu a ga-esi gbochie ya, ị mara na ihe e kwuru ezughị oke. Mbụ, ndị ọrụ nchekwa niile dị n’ala anyị ga-ebili tinye anya na mmiri, ma kee ajị n’ume ka ihe ọjọọ ndị a kwụsị. Ha kwesịrị ịdị na-agagharị n’ogbe niile ka anya ha na-eru n’ebe ndị ntorobịa nọ maka na ha na-adị anọ n’ọhịa maọbụ ụlọ a