E liela ozu Anyachebelu n’Oraukwu
E MEELA mmemme elimozu otu onye nnukwu omebe ọgwụ, Pharm.Sir Ephraim Chukwugozie Anyachebelu (KSC), onye a maara dika Sir Gauze. Ọ bụonye Amaeze Oraukwu nke dị n’okpuru ọchịchị Idemili North na steeti Anambra. Ọ gbara afọ ịrị isiina atọ tupu ọ laa mmọ. Ofufenlo elimozu ahụ e mere n’ụlọụka St. Thomas Anglican Church Oraukwu dọtara nnọọ ọtụtụ ndịeji okwu ha agba izụ dịka Achbishọpụ nke Niger nakwa Bishọpụ uka Anglican naDayọsisi Awka, Most Rev. Alexander Chibuzo Ibezim, ndị Archdikọn, ndị ụkọchukwu,ndi Naitị, Igwe Ezechuamagha nke Ogidi, Igwe Onyido Alex Uzodimma, Onyeisi Onitsha Chamber of Commerce, Sir Christ Ukachukwu, Onyisi PharmacistCouncil nke Nigeria, Prof. Ahmed TijjaniMora na ndị ọzọgazị. Tupu ọ nwụọ, Chukwugọzie Anyachebelu rụrụ ọrụ dịka Onyeisiotu ‘Awka Chamber of Commerce, Industry, Mines and Agriculture’, sorokwa n’otu‘Manufacturers Association of Nigeria’ ma bụrụ Onyisi Gauze Pharmaceutical andLaboratory Ltd. Awka. E bipụtara akwụkwọ mbọ ọ gbara n’ụwa a n’ọnwa Febụwarị