Posts

Showing posts with the label Anya mmiri ala anyị

Anya mmiri ala anyị

ALA Naịjiria ebegbuo onwe ya n’akwa Anya mmiri anya mmiri ebe niile Akwa ụtụtụ, akwa ndeeri na akwa arịrị Onye ga-azọ ala anyị?   Chi ọbụbọ were aka ekpe were dupụta ya ụra Chi ọjọọ ewere akwa arịrị dúbàà ya Ihe na-ebenụ aka na-ebekwa Onye ga-azọ ala anyị?   Naịjiria bụ nne chị ụmụ Ndị ọchịchị bụ di bi ụlọ Nne na nwa ebegbuo onwe ha n’akwa Agụụ, anya mmiri, akwa arịrị ebe niile Onye ga-azọ ala anyị?   Lekene nwaanyị na mma ya Na ụbara ụmụ chi jiri gọzie afọ ya Ma di ya ekweghị ka o rite ihe nwa ya Wee na-amị ya ọbara ka anwụnta Nnewi Onye ga-azọ ala anyị?   Ezi na ụlọ ya nọ n’ọgbaghara Ma di ya adịghị emezị ka nwoke Egbe ebukọchaala ụmụ ya na Benue, Dapchi na Chibok Ma di ya ekwughị ihe ọbụla ma ọlị Dịka a gà-asị na ọ macha ihe na-eme Onye ga-azọ ala anyị?   Di ya ezugbuola ohi, ma bube ya ọnụ nri Ụmụka nọzịkwa n’agụụ, ọbụnadị n’ikpo nri ha nwèrè Ya bụ ògòlì nwaanyị agbaa isi awọ na-erughị eru Anya mmiri ejugokwa ọgọdọ ya Onye ga-azọ ala anyị?   Nwoke ahụ agbaala ya ọtọ n’ọmà ahịa Chaị