Onye ọkụ azụ achọtala nwaanyị furu efu kemgbe ahọ abụọ, ka ọ dị ndụ na-ese n'elu mmiri
OTU nwaanyị aha ya bụ Angelica Gaitan, gbara afọ iri anọ naisii bụ onye a na-achọ achọ kemgbe afọ abụọ, e seela n’elụ mmiri na Colombia. Nwaanyị ahụ na-arịa ọrịa‘hypothermia’ nke bụ na ọ naghị enwecha ike ịgwa mmadụ okwu. Ọ bụ ndị ọkụ azụ,Rolando Visbal na enyi ya Gustavo gbara mbọ zọpụta ya ka a hụrụ ya ebe ọna-esegharị n’etiti nnukwu mmiri (sea) ahụ. Ha kenyere ụdọ n’ihe na-eme ka mmadụghara imịla na mmiri (life saver) wee tụnyere ya nwaanyị ahụ bụ onye serelan’elu mmiri ihe ruru awa asatọ. Ya mere, ha jiri ụdọ ahụ dọta ya n’ụgbọ mmiriha ji, wee maburu ya tinye n’ime ụgbọ ahụ. Otu o sila dị, ebugala nwaanyị ahụ ụlọọgwụ; nwa ya nwaanyị bụ Alejandra Castiblanco kọwara naya amaghị ebe nne ya nọ kemgbe afọ abụọ ahụ. Ka ọ dị ugbu a, ndịuweojii na-emezi nnyocha ịchọpụta ebe nwaanyị ahụ nọ kemgbe afọ abụọ ahụ o furuefu.