Posts

Showing posts with the label Anazodo

Anazodo abụrụla onye ndụmọdụ pụrụ iche Obiano

Nye Akabuike nkwanye ùgwù .. DỊKA a sị na ezi ụgwọ na-esochi ezi ọrụ, aka na-achị steeti Anambra, bụ gọvanọ Willie Obianọ akpọlitela Oriakụ Amala Anazodo n’ọkwa ọhụụ dịka onye ndụmọdụ pụrụ ichè nye ya n’ihe gbasaara ụlọ omebe iwu. Gọvanọ Obianọ kwùwàrà ma mee ka ụwa mara nke a na nzùkọ isi ọchịchị steeti ahụ n’isi mbido izuụka a n’obi gọọment dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ. N’okwu ya oge ọ na-eguzobe  ya bụ nwa amadi n’ọkwa ọhụụ ahụ, gọvanọ Obianọ nyèrè ya ndụmọdụ ka o webàta ahụmihe na amàmihe ya dịka onye omebe iwu n’oge mbụ n’ọrụ ahụ, ma gwa ya n’ọrụ ya  metụtara ihe na-eme n’ụlọ ọgbakọ omebe iwu etiti na nke steeti. Ọ dụrụ ya ka o nye aka n’ịkwàlìtè ezi mmekọrịta n’etiti n’etiti isi ọchịchị gọọmenti na ndị omebe iwu, ma kpọkùkwazie ya ka ọ gbaa mbọ hụ na nke ahụ pụtara ihè. Gọvanọ Obianọ nọkwàrà na ya nzukọ wee nye kọmishọna na-ahụ maka ahụ ike n’oge gara aga na steeti ahụ, bụ Dọkịta Josephat Akabụike nkwanye ùgwù site n’inye ya àsàmbodo mkpọtụrụ pụrụ ichè, n’ihi ọrụ ọma dị ich