Posts

Showing posts with the label Anambra Steeti

Gọọmenti Anambra ekwela nkwà ikwàlitè ọnọdụ ahụike ọhaneze

Image
AKA na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo agbapeela ogige nlekọta ahụike ọhụrụ a maara dịka ‘Dame Irene Okwuosa Memorial Hospital’ n’Oraifite dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ewusigo.   N’okwu ya oge ọ na-agbape ụlọ ahụike ahụ, Gọvanọ Soludo mere ka a mara na ala Nigeria nọ n’ogoogo nke iri atọ na otu n’ebe e nwere ọnwụ sitere n’ọrịa obi, ma kwuo na ụlọọgwụụ obi ahụ ga-enyere ndi Anambra aka ilekọta ọnọdụ ahụike ha, okachasị dịka o siri metụta ọrịa Ibi.   Gọvanọ Soludo, nke ọ bụ osote ya, bụ Dọkịta Onyekachukwu Ibezim nọchitere anya ya na mmemme ahụ, kwuru na ahụike so n’ezi ihu n’atụmatụ ọchịchị ya ji n’aka na steeti Anambra, ma kwukwa na ọchịchị ya ga-enye ya bụ ọmarịcha ụlọ ahụike ezi nkwàdo zuru òkè.   O kelere onye rụrụ ya bụ ụlọ ahụike, bụ Emeka Okwuosa maka iwèlàtàrù akụnụba ya ụlọ site n’ịbịa wuo ya bụ agidigba ụlọ ahụike, ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ọzọ bụ ụmụafọ steeti ahụ ka ha ṅomie ya. Osote Gọvanọ Anambra, Dọkịta Onyekachi Ibezim (n’etiti) na ndị ọzọ oge ọ na-agbap

Abụ: Anambra Steeti ìhè ala anyị

ANAMBRA Steeti Ihe ala anyị Obodo mara mma Igwe bụ ike Obodo e ji ama atụ Nwere evu nwee mpụ Na-ewu n’ugwu Na-ewu na ndịda Obodo dị ike Ọlụugbo, ọlụaka ịzụ ahịa, nka na ụzụ Na-agara ozi Obodo wetere ìhè N’ala Nigeria Site n’izi ụzọ Tinyekwara ịgba mbọ Nnamdi Azikiwe Kpara ike Ọbụzị Odumegwu Ojukwu Alex Ekwueme Na ndị ọzọ nile Anambra Steeti Ñụrịba Akpọkuedike Kpara ụgbọ gaba!

Obiano akpọkuola ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ ka ha dịwanye uchu n'ọrụ

… Dịka e wèrè mmadụ 120 ọhụrụ n’ọrụ nsọnyụ ọkụ steeti Anambra AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obianọ akpọkuola ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ ka ha jisie ike n’ọrụ ma welitekwuo aka n’usoro inye ọhaneze nkuzi ihe ha kwesiri ịma banyere igbòchi ọkụ ọgbụgba kpamkpam na steeti ahụ.   Gọvanọ Obianọ nyere ndụmọdụ a n’okwu ya na mmemme nchịkọta ọzụzụ na agụmakwụkwọ mmadụ otu narị na iri abụọ (120) e were n’ọrụ ọhụrụ n’ụlọọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ, ma bụrụkwa nke weere ọnọdụ n’ama egwuregwu Alex Ekwueme dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.   Gọvanọ Obianọ, nke onye nọchitere anya ya bụ osote ya bụ Dọkịta Nkem Okeke mere ka a mara na ọnụọgụgụ ọkụ ọgbụgba n’ime steeti ahụ dịzị ala ugbua karịa ka ọ dị na mbụ, ma kelee ndị ọrụ nsọnyụ ọkụ steeti ahụ maka nke ahụ, ọbụladị dịka o cheteere ha na ha ka nwekwara ọtụtụ ọrụ chere ha n’ihu, ọkachasị dịka o siri metụta ịkọwara ọhaneze ihe ha kwesiri ịma banyere ọkụ ọgbụgba, na ime ka ihe banyere ọkụ ọgbụgba bụrụ akụkọ mgbeochie n’ime steeti ahụ.  

Anambra etoola ụlọọrụ Rotech maka ịkwalite ọrụ mmepe

IGBO sị na ọ na-abụ e tòó nwaanyị gwọrọ akịdị mmamma, ọ gwọtakwuo ọzọ.   Ka ọ dị taa, ọchịchị steeti Anambra etòóla ụlọọrụ ‘Rotech Energy Services Limited’ maka ọrụ mmepe dị iche iche ha na-arụ n’ime steeti ahụ, ọkachasị ogige ebe obibi ahụ a kpọrọ ‘Anambra Luxury Place Estate, Nkwelle-Ezunaka’, bụ nke nyegoro aka n’ịkwàlite ọnọdụ mmepe steeti ahụ.   Gọọmenti Anambra kwupụtara ma nye òtùtó a oge a gara ileta ka ọrụ si aga na mpaghara ebe ahụ a na-arụ ogige ebe obibi ‘Anambra Luxury Place Estate’ ahụ na Nkwelle- Ezunaka dị na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo Oyi.   Ọ bụ Kọmishọna na-ahụ maka ewumewu ụlọ na steeti ahụ, bụ Dọkịta Michael Okonkwo, na onyeisioche ụlọọrụ ‘Anambra State Investment, Promotion and Protection Agency, (ANSIPPA)’, bụ Maazị Jide Ikeakor nọchitere anya gọọmentị steeti Anambra na njem nleta ọrụ ahụ.   N’okwu ya oge ọ na-edugharị ndị ọrụ gọọmenti n’ebe ahụ a na-arụ ya bụ ogige, onyeisioche ụlọọrụ ‘Rotech Energy Services Limited’ bụ Maazị Augustine Oguejiofor nyere nk

Aka ndị uweojii Anambra akparala ndị ohi iri na isii, ndị wuru-wuru abụọ

NDỊ uweojii steeti Anambra nọrọ na nsonso a wee nwụchie mmadụ iri na isii a na-enyo enyo na ha bụ ndị adịgboroja na-ana ụtụ n’ụzọ iwu akwadòghị, ma sikwazie n’ụzọ dị etu ahụ na-anapụsị ụmụ mmadụ ego ha tara ahụhụ wee kpata.   Nke a bụ nke e mere ka ụwa mara site n’ozi onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti Anambra, bụ Maazị Haruna Mohammed kụpụụrụ ndị nta akụkọ na nsonso a.   Dịka o siri kọwaa n’ozi ahụ, ndị ahụ bụ ndị e jidere na mpaghara ebe dị iche iche n’Ọnịsha, nke gụnyere mpaghara isi àkwà mmiri Niger, mpaghara ‘Upper Iweka’, mpaghara ‘Owerri Road’ na mpaghara ebe ndị ọzọ, site n’aka ndị uweojii ahụ, nke ọ bụ ACP John Ogbuagbaka duru ha wee gaa.   Ọ gara n’ihu kọwaa na ọ bụ ụbọchị Mọnde ka a nwụchikọrọ ndị ahụ, ma mee ka a mara na a ga-akpụpụ ha ụlọikpe ma e mechaa nnyocha banyere ihe ahụ ha mere, ebe a ga-anọzị wee nye ha ọnọdụ ruru ha, dịka ihe ha mere siri dị.   N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti Anambra, bụ CP John Abang kọwàrà na

Amachiela ịnakọ ụtụ n'okporoụzọ ọbụla na steeti Anambra

NDỊ Igbo kwuru sị na ọ bụrụ na a gbaghị ụzọ owere mgba, ọ naghị echi. Ya mere, n’ihi oke ịna ụtụ (revenue collection) nke ndị omekome na-ana n’okporoụzọ nke mere na amakwaghị ndị na-anakọ ụtụ na ndị bụ adịgboroja, gọọmenti steeti Anambra amachiela ịna ụtụ n’ụzọ ọbụla n’okporoụzọ niile dị na steeti ahụ. Nke a bụ iji wee gbochie ajọ ihe dị otu ahụ.   Ozi si n’aka Kọmịshọna na-ahụ maka mgbasa ozi na ịkụzịrị ọha na eze ihe ha kwesịrị ịma na steeti ahụ bụ C. Don Adinuba kwuru sị: “Site ugbu a, gọọmenti steeti Anambra ekpebiela ịmachị ịna ụtụ ọbụla n’okporoụzọ. Onye ọbụla enyela mmadụ ọbụla nọ n’okporoụzọ sị na ọ bụ onye ọna ụtụ gọọmenti ego. Ndị mmadụ ga-ajụ ụdị mmegide na ịnapụ ego n’ike dị otu ahụ. Ya mere, onye ọbụla pụtara n’ụdị na ọ bụ onye ọna ụtụ gọọmentị ma na-anakọ ego n’okporoụzọ ọbụla na steeti a, sị kpesara ndị na-ahụ maka iwu ozugbo. A ga-enye ndị ahụ ọ dị n’aka aha na adreesi onye ahụ n’egbughị oge ọbụla. A ga-ewetakwa foto onye dị otu ahụ nke dị mfe inweta n’ọgbọ ọhụrụ a e nw

N'Anambra, mmadụ abụọ anwụọla n'ihe mberede okporo ụzọ

KA ọ gachara ihe dị ka otu izuụka mmadụ anọ tụfùrù ndụ han’ihe mberede okporo ụzọ dapụtara na steeti Anambra, ụmụnwoke abụọ ọzọ nọkwakwarana nsonso a wee nwụọ n’ihe mberede okporo ụzọ dapụtara n’ime steeti ahụ.   Dịka ozi a kụpụrụsite n’aka onye na-ahụ maka mgbasaozi n’ụlọọrụ ‘Federal Road Safety Corps(FRSC)’ ngalaba steeti Anambra, bụ Maazị Kamal Musa siri kọwaa, ya bụ ihemberede okporo ụzọ bụ nke dapụtara n’akụkụ Coca Cola dị n’Ọnịtsha na mpaghara okporoụzọ awara-awara ahụ siri Ọnịtsha gaa Enugu.   O mere ka a mara naya bụ ihe mberede okporo ụzọ dapụtara n’etiti ụgbọala bọọdụ Mitsubishi nwereakara JJT 943 XA na nukwu ụgbọala gwongworò M/Benz nwere akàrà FGG 612 YG.   Ọ sịkwa na ihekpatara ihe mberede ahụ bụ otu ụgbọala bọọsụ mebìrì emebì ma bụrụkwa nke dịchiriokporo ụzọ, mana onye nwe ya etinyeghị ihe ọbụla na-egosi na ụgbọala ahụ mebiriemebi ebe ahụ a dọbara ya; o wee dịchizie ụzọ ma na-egbochi ndị na-akwọ ụgbọalaịhụ ụgbọala di n’akụkụ nke ọzọ were agbapụta. Ọ bụzị n’ihi ahụchaghị ụ

Anambra ga-ekesa ụlọakwụkwọ tamomịta dị otu puku ma ha meghee

KỌMISHỌNA na-ahụ maka mmụta na steeti Anambra bụ Ọkammụta KateOmenugha ekwupụtala na gọọmenti ga-ekesa ihe e ji enyocha ọnọdụ ahụike mmadụ(infrared themometers) dị otu puku iji wee kwadebe maka mmalite agụmakwụkwọ dịkaa ga-ebido akwụkwọ.   Omenugha onye gwarandị ntaakụkọ banyere nke ahụ n’Awka, isi obodo Anambra, kwupụtara na ọ bụ ndịisi(State Executive Council) nyere nkwado maka ya.   Ọ kọwara na aga-ekesa tamọneta ndị ahụ n’ụlọakwụkwọ prịma na sekọndịrị gọọmenti (public).   Ọ gakwara n’ihu kwuona ụlọakwụkwọ dị na steeti ahụ nwetara akọrọngwa ya (equipment) n’oge e busoro ọrịaEbola agha n’afọ 2014.   Dịka o siri kwu, nkeahụ bụ iji hụ na ụlọakwụkwọ zuru oke dịka iwu e tiri maka korona siri dị.   Ihe ndị ọzọ gụnyerebọkeeti na ncha e ji akwọ aka bụ ụlọakwụkwọ ga-enwetazi ndị ahụ.   Omenugha kwuru nasteeti Anambra ga-emezu ihe niile otu o kwesịrị, ọ kachasị n’ihe gbasara ule2020 WASSCE na nke JSSE.

Anambra agaghị ada mbà n'ibusò mbize agha – Ivenso

IGBO sị na ọnụ anaghị ezu ike ma ọ bụrụ na ihe ọ na-ata agwụghị.   N’ịgbaso nke a,onyeisi ụlọọrụ ahụ na-ahụ maka ibu agha megide nsogbu mbize n’ala Nigeria, bụ ụlọọrụ‘Nigeria Erosion and Watershed Management Agency Project (NEWMAP)’ n’ime steetiAnambra, bụ Maazị Michael Ivenso ekwuola na ụlọọrụ ahụ na gọọmenti agaghị adambà n’agha ọ na-ebu megide mbize na mpaghara ebe dị iche na steeti ahụ.   Maazị Ivenso kwupụtaranke a n’ihe mmemme mkparịtaụka ya na ndị nta akụkọ a kpọrọ ‘Meet the Media’, bụnke weere ọnọdụ n’isi ụlọọrụ oyibo steeti ahụ. O mere ka a mara na e nwere eberuru otu puku n’ọnụọgụgụ mbize na-enye nsogbu n’ime steeti Anambra, ma kwuo na ọrụna-aga n’ihu na mpaghara iri na anọ n’ime ebe ndị ahụ ugbua, ebe a rụchagokwaraatọ ndị ọzọ arụcha, bụkwa nke Gọvanọ Willie Obianọ ga-agbape n’oge adịghị anya.   Dịka ọ na-agbaakaebe na naanị amụmà ego ọrụ gọọmenti steeti Anambra na-amà apụghị igbònwunsogbu mbize steeti ahụ, Maazị Ivenso gara n’ihu kọwaa na ụlọọrụ NEWMAP bụ njikọakagọọmenti e

Ndị Uweojii ejidela ndị ohi atọ n'Anambra

N’ỊGAWANYE n’ihu n’agha ahụ ọ na-ebu megide ohi, mpụ na arụrụalan’ime steeti Anambra, ndị uweojii steeti ahụ nọrọ na nsonso a wee nwụchie mmadụatọ maka izu ohi.   Onye na-ahụ makammekọrị ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Maazị Haruna Mohammed bụ ya kwụpụtaranke a site n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ iji mee ka ụwa mara bànyere nke ahụ.   Dịka o siri kọwaa,mmadụ atọ ahụ gụnyere Maazị Onyebuchi Osadebe (gbara ahọ iri abụọ na asatọ ma bụrụkwaonye obodo Akwu-Ukwu, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Idemili South nke steetiAnambra); Maazị Chibuike Ebere (gbara ahọ iri abụọ na atọ, ma bụrụkwa onyeokpuru ọchịchị ime obodo Isiala Mbano nke steeti Imo); na Maazị Umoke Kelechi(gbara ahọ iri abụọ na abụọ, ma bụrụkwa onye sitere okpuru ọchịchị Ikwo nkesteeti Ebonyi).   O mere ka a mara nammadụ atọ a nọrọ na abalị iri na otu nke ọnwa a, wee jiri egbe wakpò otu nwoke,bụ Maazị Emmanuel Obi n’Akwa-Ukwu, wee zuo ya ohi ego narị puku naịra asaa(700,000), puku yurò asatọ (£8000) na puku dọlà atọ ($3000),