EFCC ejidela ndị 'Yahoo Yahoo' iri na anọ n'Anambra
ONYE a gwara agwa ma ọ nụghị anụ, o mee emee, ọ hụ ahụ. Ka ọ dị taa, ụlọọrụahụ na-ahụ maka ibu agha megide igwù ojoro na ịmazụ ego ọhaneze n’ala Nigeria,bụ ụlọọrụ ‘Economic and Financial Crimes Commission (EFCC)’ anwụchiela mmadụiri na anọ a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-egwu ojoro site n’usoro nzikọrịta oziọgbara ọhụụ ịntaneetị a maara dịka ndị ‘Yahoo Yahoo’. Dịka ozi a kụpụrụsite n’aka onye na-ahụ maka mgbasa ozi n’ụlọọrụ EFCC, bụ Maazị Dele Oyewalesiri kọwaa, mmadụ iri na anọ ahụ bụ ndị a nwụchikọrọ site n’aka ngalaba ụlọọrụahụ na mpaghara ndịda-ọwụwa anyanwụ, ma bụrụkwa ndị a nwụkọtara dịka ụmụ ọkụkọsite na mpaghara ebe dị iche iche n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, nke gụnyereỌkpụnọ, Agụ Awka, na Ngọzịka Esteeti. Dịka o siri kọwaa,ndị ahụ a nwụchiri bụgbado ụmụokorobịa, ma bụrụkwa ndị nọ n’agbata ahọ iri abụọna ótù, wee ruo n’ahọ iri abụọ na asatọ. Ọ sịkwa na ihe e nwekọtara n’aka ndịahụ gụnyere ụgbọala oke ego dị iche iche, nke gụnyere ‘Mercedes Benz 4matic’ atọ,‘Mercedes