Posts

Showing posts with the label Anambra INEC

N’Anambra, INEC ekesàala ihe a ga-eji tụọ akwụkwọ na Satọdee

DỊKA otu ụzọ n’ịkwadobe ọnọdụ maka nhọpụta izugbe ahụ a ga-eme ụbọchị Satọdee, ụlọ ọrụ ahụ na-ahụ maka nhọpụta ọchịchị n’ala anyị, bụ ‘Independent Electoral Commission’ (INEC), ngalaba ya nke steeti Anambra ekesaala ihe dị iche iche a ga-eji wee mee ya bụ ntụli aka. Ya bụ nkesà akụrụngwa bụ nke e mere ụnyaahụ n’ụlọ ọba ego ala anyị dị n’Awka, bụ isi obodo steeti ahụ, ebe e siri wee busaa akụrụngwa ndị ahụ gaa n’ime okpuru ọchịchị iri abụọ na otu e nwere na steeti ahụ. N’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ banyere nke ahụ, onyeisi ụlọ INEC na steeti ahụ, bụ dọkịta Nkwachukwu Ọrjị mere ka a mara na nke ahụ bụ iji hụ na akụrụngwa ndị ahụ niile ruchara ebe a ga-eji ha rụọ ọrụ n’oge ma zukwa òkè, n’ihi na a ga-eweputakwa oge wee nyochaa ihe ndị ahụ niile ma e busachaa ha, iji hụ na o nweghị nke na-eri mperi tupu ụbọchị nhọpụta. O mere ka a mara na ụlọ ọrụ ahụ adịla ezi njikere ugbu a ịchịkọba nhọpụta ọchịchị ghe anya oghe, n’ihi na ha e werela otu izu ụka ahụ e bugharịrị nhọpụta ahụ wee tinyesie haz

N'Anambra, INEC edebànyela aha mmadụ karịrị ndè abụọ n'akwụkwọ

Izunna Okafor   DỊKA afọ 2019 na nhọpụta izugbe na-akpụdobe nso n’ala anyị, ozi e nwetara na-akọwa na otu ahụ n-ahụ maka nhọpụta ọchịchị n’ala Anyị, bụ INEC n’aha ịchafụ edebànyela aha mmadụ ruru ndè abụọ na narị asatọ n’akwụkwọ na steeti Anambra maka inweta akwụkwọ ikike ha.   Nnukwu onye enyèmaka pụrụ iche nye aka na-achị steeti ahụ bụ Gọvanọ Willie Obianọ n’ihe gbasaara ọlụ pụrụ iche na inweta akwụkwọ ikike e ji atụ akwụkwọ, bụ Dọkịnta Amaka Akudo mere ka a mara nke a n’okwu ọ gwàrà ndị nta akụkọ n’isi ụlọ ọlụ ya dị n’Awka.   O mere ka a mara na ọ bụ ihe dịka mmadụ ruru ndè abụọ na ụma asaa debànyere aha n’akwụkwọ na steeti ahụ n’afọ gara aga n’ịkwadobe maka nhọpụta ọkwa gọvanọ ahụ e mere na ya, ma sịkwazie na ọ bụ site n’ọkwà pụrụ iche a na-ama n’ebe dị iche iche na steeti ahụ na otu e sikwa ajali ndị mmadụ banyere idebànye aha ma inweta ya bụ akwụkwọ ikike ahụ mere ọnụ ọgụgụ ahụ jiri gbagoo n’ike. Dọkịnta Akudo kwara arịrị na e nwere ọtụtụ akwụkwọ ikike dọọrọ n’ụlọ ọlụ ndị INEC na