Posts

Showing posts with the label Anambra Etiti n'ụlọ ọgbakọ

A ga m aga n'ihu na-enye ndị be anyị ezi nnọchi anya – Umeh

NWA amadi ahụ na-anọchi anya ọgbọ nta nkwàdo Anambra Etiti n’ụlọ ọgbakọ Sineeti ala anyị, bụ Maazị Victor Umeh ekwunwòóla njìkere ya ịga n’ihu n’inye ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ na ụmụafọ Igbo niile ezi nnọchi anya, iji hụ na okè ha efughị cháá cháá. Maazị Victor Umeh kwupùtara nke a n’okpuru ọchịchị Idemili North nke steeti Anambra oge ọ gara ịgbape achụmnta nkwàdo ya na mpaghara ahụ maka nhọpụta izùgbe ahụ na-abịa n’ihu n’ala anyị. O kwùru na ya agbago ọtụtụ mbọ pụtara ìhè ma mepụtakwa ọtụtụ ihe a hụrụ anya na nkenke mgbe ọ nọgòró n’ụlọ ogbakọ sineeti ahụ, gosipụta njìkere ya ime nke ka nke o megòrò eme ma ya gaghàchi, ma kpọkùkwazie ndị ọgbọ nta nkwàdo ahụ niile ka ha tụnyere ya na otu ndọrọ ndọrọ APGA na nhọpụta ahụ, iji mee ka ezi nnọchi anya dị otu ahụ gaa n’ihu ma gúzosie ike. Na ntụnye nkè ha n’otu n’otu, onyeisi oche otu ndọrọ ndọrọ APGA n’okpuru ọchịchị Idemili, bụ Maazị Kentus Ọnwụrah na onyeisi oche nchere ogè n’okpuru ọchịchị ahụ, bụ Maazị Raphael Nnabụife kọwara Umeh dịka nwo