Anambra 2021: APGA ahọpụta Soludo dịka onye ga-eji aha ya zọọ ọkwa gọvanọ
NDỊ otu ndọrọndọrọ ọchịchị ‘All Progressive Grand Alliance (APGA) na steeti Anambra nọrọ ụbọchị Wenezdee wee họpụta nwa amadi ahụ jibụrụ ọkwa dịka onyeisi ụlọakụ ala Nigeria (Central Bank of Nigeria, CBN), bụ Ọkammụta Chukwuma Charles Soludo dịka onye ga-eji aha ya bụ otu ndọrọndọrọ wee zọọ ọkwa gọvanọ steeti Anambra na nhọpụta ahụ a ga-eme na steeti ahụ. Nhọpụta ahụ a họpụtara Ọkammụta Soludo bụ nke e mere na nhọpụta ime ụlọ otu ndọrọ ndọrọ APGA, bụ nke weere ọnọdụ n’ogige ‘Dora Akunyili Women Development Centre’ dị n’Awka bụ isi obodo steeti Anambra, ma bụrụkwa nke ọtụtụ ndị dị iche iche e ji okwu ha agba izu n’otu ndọrọndọrọ ọchịchị ahụ sonyèrè na ya, tinyere aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ; Ọkaokwu ụlọ omeiwu steeti ahụ, bụ Maazị Uche Okafor, na ọtụtụ ndị ọzọ. Dịka mpụtàrà ya bụ ịtụ akwụkwọ siri kọwaa, ndị ọzọ dị iche iche soro wee zọọ nkwàdo na ikike ahụ nwètàkwàrà ụfọdụ nkwàdo olenaole, mana nke Ọkammụta Soludo kacha n’ọnụọgụgụ, bụzị nke nyere ya mmeri ahụ