Ịrụ okporoụzọ so na nkwà m nkwere ndị Anambra – Soludo
AKA na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Chukwuma Soludo ekwuola na mbọ niile ahụ ọchịchị ya na-agba idozi na ịrụ ezi okporoụzọ bụ ịgba na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ, bụ mmezupụ̀ta otu n’ime nkwà o kwèrè ndị Anambra mgbe ọ na-azọ ọkwa ọchịchị na ụbọchị ahụ e duru ya n’iyi ọrụ. Gọvanọ Soludo kwupụtàrà nke a oge ọ gara gbapee mmalite ọrụ okporoụzọ ụzọ na mpaghara ebe dị icheiche na steeti ahụ na nsonso a. Okporoụzọ ndị ahụ ọ gbapere gụnyere okporoụzọ ahụ jikọtara Nanka na Isuofia dị n’okpuruọchịchị Aguata, nke ogologo ya ruru kilomita abụọ na ụma abụọ; okporoụzọ ahụ siri njikọụzọ UNIZIK Junction gaa Okpuno na Isuaniocha (dị n’Awka), nke ogologo ya ruru kilomita iri na anọ na uma iri anọ na asatọ. Ndị ọzọ gụnyèrè okporoụzọ Ajali-Akpu-Nawfija-Ufuma-Ogbunka, nke ogologo ya ruru kilomita iri na isii na ụma anọ; okporoụzọ Ugwuagba-Mgbuka-Obosi, nke ogologo ya karịrị kilomita asaa; na okporoụzọ Ogbufo; Okpunoeze Uruagu na Umudim dị na Nnewi. N’okwu ya oge ọ na-agbape mmalite ọr