Posts

Showing posts with the label Anụụlọ

Anụụlọ na uru ha bara

ANỤỤLỌ bụ anụmanụ ndị bi n’ụlọ. Dịka anyị maara, e nwekwara anụmanụ ndị bi n’ime ọhịa.  Anụụlọ gụnyere ehi, ewu, atụrụ, ọkụkọ, nkịta, nwamba w.d.g. Anụmanụ ndị a na mmadụ na-ebi n’ụlọ n’enweghị nsogbu ọ bụla.Ụfọdụ ka a na-aba aha, ị kpọọ ha, ha aza.Ịzụ anụụlọ bara nnukwu uru na ndụ mmadụ.   E wepu iji ha akpata ego na ihe oriri, tinyere uru ndị ọzọ, ụfọdụ mmadụ na-ewere ha dịka ihe na-enye ha obi aṅụrị nke bekee kpọrọ pet. Otu nwaanyị onye ọcha nwere ọtụtụ nwamba kwuru n’akwụkwọ ọgụgụ na o nweghị ihe dịka nwamba, na ọ ka mmadụ mma. Nke a pụtara na o nwere ntụkwasa obi na nwamba karịa ebe mmadụ nọ.   Ya mere, ndị Igbo kemgbe ụwa ji bido, na-azụ anụụlọ. Mgbe gboo, ndị Igbo nwere nkwenye na ọnwụ bata na be mmadụ ọ hụghị anụmanụ ọ ga-egbu, o gbuo mmadụ. Ya mere, ha anaghị ekwe ka anụụlọ kọ n’ụlọ ha.   Otu nwaanyị aha ya bụ Ọriakụ Rosa Nwandụ onye na-azụ ewu kwuru sị; “Ana m azụ ewu ka ọ ga-abụ ihe ike bata n’ụlọ m, kama ọ ga-eti m, o tie ewu.Nke ọzọ bụ na ewu na-enye m ego n’ihi na ọ bụrụ