Posts

Showing posts with the label Anụ Mbe

Mmadụ iri na iteghete anwụọla ka ha tachara anụ mbe

NDỊ mmadụ dị iri na iteghete n’ọnụọgụ nke gụnyere ụmụaka iteghete na ndị okenye iri anwụọla na mba Madagascar ka ha tachara anụ mbe.   Ụlọọrụ na-ahụ maka ahụike na erimeri na mba ahụ Health and Food Safety Control Agency kwuru sị na e bugara mmadụ iri atọ na anọ ụlọọgwụ Vatomandry dị n’ọwụwa anyanwu ebe ahụ (East) ka ha richara anụ mbe ahu, ụdịrị nke e chekwara echekwa.   A kọwakwara na ka mmadụ iri nwụchara, na ụmụaka iteghete nwụrụ n’ụlọ ka ha tachara anụ mbe ahụ.   Ndị ọnọdụ ahụike dị n’aka adọọla ndị mmadụ aka na ntị ka ha hapụ ịdị na-eri anụ mbe tinyere ụdịrị azụ iri abụọ na anọ (two dozen species of fish) bụ ndị e ji ‘algae’ zụọ bụ nke nwere ike ịdị ‘toxic’ n’oge ekpomọkụ ọnwa Nọvemba ruo Maachị.   Oke ọnwụ nke na-esite na nsi dị n’ihe oriri (food poisoning) na-adapụta afọ ọbụla na mpaghara ‘Coastal Madagascar’.