Ndị nche Amotekun ejidela ndị jere ohi n'ụlọ akụ WEMA n’Okuku
IHE ọ sọrọ mkpụrụ ji ya zobe n’ime ala, e mechaa onye nwe ubi ga-ahụrịrị ya anya. Ọ hụghị ya na ndụ, ọ hụ ya n’ọnwụ. N’ịgbaso nke a, ndị ọrụ nchekwa Amotekun anwụchikọọla mmadụ abụọ a na-enyo ènyò na ha soro wee gaa ohi ahụ dara ụda e zuru na ngalaba ụlọakụ ‘Wema Bank’ dị n’Okuku, n’okpuruọchịchị ime obodo Odo-Otin nke steeti Osun. Ndị ahụ e jidere gụnyere Maazị Kehinde Babalola (gbara ahọ iri abụọ na atọ) na Maazị Timileyin Afolabi (gbara ahọ iri na iteghete, ma bụrụkwa ndị a nwụchikọrọ ụbọchị Tuzdee oge ha na-achọ izu ohi ọzọ n’obodo ahụ. Ọ bụ oge a na-agba ya ajụjụọnụ ka Maazị Kehinde Babalola, onye bụ onye Ogbomoso jiri ọnụ ya wee sàá asịsà na ọ bụ ya duru ndị òtù ohi ahụ bịara wakpòrò ndị òtù ohi ahụ bịara wakpò ụlọakụ Wema Bank na mgbe gara aga. O jikwara ọnụ ya wee sàá asịsà na ọ gaala ohi n’ọtụtụ ebe dị icheiche n’oge mbụ, ma n’Ibadan, ma na mpaghara Ile-Ife, ma na-eyikwa ụmụakwụkwọ égwù na mpaghara mahadum steeti Osun, bụ ‘Osun State University’ (ngalaba nke Okuku).