Onye Omeiwu Anambra, Ozobialu amalitela ịrụ ụlọ ahụike n'Ogbodi, Amichi
Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na nsonso a, dịka onye omeiwuahụ na-anọchite anya ọgbọ nta nkwàdo ‘Nnewi South’ nke mbụ n’ụlọ omeiwu steetiAnambra, bụ Maazị Sonny Ozobịalụ malitere ịrụ ụlọ ahụike n’Ogbodi, dị n’Amichi,n’okpuru ọchịchị ‘Nnewi South’ steeti Anambra. N’okwu ya na mmemmeahụ, ya bụ onye omeiwu mèrè ka a mara na ịrụ ụlọ ahụike ahụ so n’otù n’ime nkwào kwèrè oge ọ na-achụ nta nkwàdo, ma mekwa ka a mara na e nweghị ọbụnadị ótù ụlọahụike ọbụla dị n’obodo Ogbodi chaachaa, bụ nke mezịrị ka ụmụafọ obodo ahụna-agabiga ihe nhịahụ iji nweta ọgwụgwọ site n’obodo ndị ọzọ gbara hagburugburu. Maazị Ozobialu, onyenọkwara na nsonso a wee malite ọrụ ịgba ògigè na ịrụnyekwu ụlọ n’otu ụlọakwụkwọdị n’Ọsụmenyi’, gàrà n’ihu mee ka a mara na ọ ga-agbakwa ụlọ ahụike ahụ ògìgè matinyesikwa ya akụrụngwa bụ ịgbà ma a rụchaa ya n’ime ọnwa ole na ole na-abịa abịa. O kèlèrè aka na-achịsteeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obiano maka ịkwàdò na ịmapụtàra ha bụ ndịomeiwu ego ha ga-eji rụrụ ndị ọgbọ nta nkwà