Posts

Showing posts with the label Amawbia

Onye ọrụ ebere amalitela ịrụ okporoụzọ ọhụrụ abụọ n'Amawbia

OTU onye ọrụ obi ebere na-emetụ na-amasị, ma bụrụkawa nwaafọ obodo Ụmụawụlụ, bụ Maazị Christopher Ndubuisi nọrọ na nsonso a wee malite ọrụ idozi okporoụzọ abụọ n’Amawbia dị n’okpuruọchịchị Awka South nke steeti Anambra.   Okporoụzọ abụọ ahụ gụnyere nke siri ụlọ ezumeezu Ebe-Akpu wee gaa ụlọ mkpọrọ dị n’Amawbia, ya na nke siri ụlọ ezumeezu ahụ wee gaa n’ụlọ onyeisioche otu ndọrọndọrọ ‘All Progressives Grand Alliance (APGA)’ n’ala Nigeria, bụ Maazị Victor Oye.   N’okwu ya na mmemme ịgbape ọrụ okporoụzọ ahụ, Maazị Ndubuisi kọwara na nke ahụ bụ imezupụta nkwà o kwere n’ọnwa gara aga na be Maazị Victor Oye, oge ọ gara ịgwa ya banyere mmasị nwaanne ya nwoke, bụ Maazị Augustine Ekweozor nwere ịzọ ọkwa onye nnọchianya ọgbọ nta nkwàdo ‘Awka North and South Federal Constituency’ n’ụlọ omeiwu etiti na nhọpụta ahụ a ga-eme n’ahọ na-abịa abịa. O kwuru na ọ bụ ụbọchị ahụ ọ gara be Maazị Oye ka ọ chọpụtara na ụzọ ebe ahụ adịchaghị mma, o wee kwe nkwà na ọ ga-arụ ya.   Dịka ọ na-ekwupụta obiañụrị ya b

Ndị Amawbịa bi USA ekesàárala ụmụafọ obodo ahụ ihe nkwàdo

ÒTÙ ahụ jikọtara ụmụafọ Amawbịa bi na mba USA nọrọ na nsonsoa wee bukọta ma kesàárá ndị dị iche iche ihe na-esiri ike n’obodo ahụ ihenkwàdo dị iche iche.   Ihe nkwàdo a bụ nkemmadụ ruru narị isii n’ọnụọgụgụ ihe na-esiri ike n’obodo ahụ kètàrà, ma bụrụkwanke ebumnobi ya bụ iji belatara ụmụ mmadụ agụụ na ihe iche aka mgba ndị ọzọ hana-agabiga n’ihi ọrịa nje korona. Ihe dị iche iche e kesààrà ndị ahụ gụnyèrèàkpà osikapa, àgwà, igbe nri noduul, tomatò, mmanụ ọpụpa na ego, tinyere ihe ndịọzọ.   Ihe ndị ahụ bụ nke atụkọtara site n’aka ụmụnwoke, ụmụnwaanyị, na ndị nwadiala Amawbịa bi mbà USA,ma bụrụkwa nke e kesàrà ndị dị ichie iche sitere ime ogbè isii e nwere n’obodoahụ, tinyere ụfọdụ ndị abụghị ụmụafọ Amawbịa bi n’obodo ahụ.  N’okwu ya na mmemmeikesà ihe ahụ, eze ọdịnala obodo ahụ bụ Igwe Nnaemeka Nworah-Muolokwu kelere ndịbutere ha maka ichètà ndị ihe na-esiri ike n’obodo ahụ, na igosi ha ịhụnanya siten’iwèlàtàrà ha ihe nkwàdo ahụ. Ọ kọwara mkpà ọ dị na onye nọ n’ụzọ ijè na-eme ọnọgide, o

N'Amawbia, nwoke na ozu nwunye ya anọọla abalị atọ n'ime ulọ

NdỊ uweojii Steeti Anambra anwụchikọọla otu nwoke gbara afọiri anọ na iteghete aha ya bụ Ikechukwu Atansi maka  ọnwụ nwunye ya Uchechi. A chọputara ya na ozu nwunye ya n’otu ọnụ ụlọ ka abali atọgachara. Njinji a jiri n’Ezimezi Amawbia n’okpuru ọchịchị Awka Southna Steeti Anambra. Otu onye bi n’ogbe ahụ kwuru si: “Nwoke ahụ na ozu nwunye yanọrọ abali atọ n’ime ụlọ tutu ozu ahụ ebido mebiwe nke mere ka isi ọjọọ sin’ime ụlọ siputaba. O bụ oge ahụ ka ndị agbataobi jiri chọpụta ihe merenụ. ọgara n’ihu kwuo na ọ na-eche na nwoke ahụ gburu nwunye ya ka o jiri ya gwọọ ọgwụego. N’akukụ nke ya, Ikechukwu kwetere na e gburu nwunye ya egbumana na aka ya adịghị n’onwụ ya. O kwuru sị; “Adara m n’ụra dị omimi oge ahụ, aghọtaghị m ihena-eme n’okirikiri m. Ugboro atọ ka m chọrọ inweta onwe m ma o kweghị m n’ihina adara m wee banye n’ura dị egwu. ọ bụ ya mere na ekpesaraghị ndị uweojii. ọbụ n’abalị nke atọ ka m nwetere onwe m wee tibe mkpu nke mere ka ndị agbataobibịa kpọọ ndị uweojịị.” Onye uweojii na-