N’Amansea, Anambra amalitela ọrụ mmetụaka ụzọ gọọmenti etiti siiri Enugu gaa Onitsha
Ọ NA-ADỊ mma ede kaa nka n’anya, a banyere ya aja n’ukwu. N’ịgbaso nke a, gọọmenti steeti Anambra amalitela ịrụ ọrụ mmetụaka na mpaghara Amansea nke okporoụzọ awara-awara ahụ si Enugu gaa Onitsha, iji mee ka ya bụ ụzọ dịtụ mma ịga aga. Ọ dị ncheta na o teela ọtụtụ ndị mmadụ na ndị òtù dị icheiche jiri kpọba gọọmenti etiti òkù ka o mee ihe bànyere ụzọ ahụ, iji belatara ndị na-eme njem ihe nhịahụ ha na-agabiga n’ịgba n’okporoụzọ ahụ, bụ nke kawanyere njọ n’oge udummiri a, ma dịkwazie imi na ọnụ ka ntọọ. Ọ dịkwa ncheta na ọchịchị gọọmenti steeti Anambra dozigharịrị mpaghara okporoụzọ ahụ dị n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, ma rụọ àkwà atọ na ya, n’agbanyèghị na ọ bụ okporoụzọ gọọmenti etiti ka ọ bụ. Ka ọ dị taa, gọọmenti steeti ahụ amàlitekwala ọrụ mmetụ aka na mpaghara Amansea nke okporoụzọ ahụ, iji mee ka ọ katụ mma. N’okwu ya banyere nke ahụ, Odeakwụkwọ ọkpụtọrọkpụ ụlọọrụ na-ahụ maka ọrụ ngo na steeti Anambra, bụ Ọkaiwu Emeka Ohuoha mere ka a mara na ọ bụ n’izuụka gara aga ka